Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Zekaraya 9:7 - Bible Nso

7 M'gēwezuga kwa ọbara nile ya n'ọnu-ya, wezuga kwa ihe-árú-ya nile n'etiti ezé-ya; ọ gāfọdu-kwa-ra Chineke-ayi, ọbuná ya onwe-ya: ọ gādi kwa ka otù onye-isi nke nnù madu abua na ọgu iri nime Juda, Ekron gādi kwa ka onye Jebus.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Aga m wezuga ọbara niile site nʼọnụ ha, wezugakwa ihe rụrụ arụ niile site nʼetiti eze ya. Ndị niile fọdụrụ ga-abụ ndị nke Chineke anyị, ha ga-adị ka otu agbụrụ na Juda. Ekrọn ga-adịkwa ka ndị Jebus.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Zekaraya 9:7
21 Iomraidhean Croise  

na ndi Jebus, na ndi-Amorait, na ndi-Giagashait;


Chineke we ziga mọ-ozi na Jerusalem ibibi ya: ma mb͕e ọ gaje ibibi, Jehova huru, we chègharia n'ihe ọjọ ahu, we si mọ-ozi ahu nke nēbibi, O zuwo; ub͕u a ra aka-gi. Ma mọ-ozi nke Jehova nēguzo n'akuku ebe-nzọcha-ọka nke Ọnan onye Jebus.


Bilie, Jehova; zọputam, Chinekem: N'ihi na I tiwo ndi-irom nile ihe na ǹtì; I tipiawo ezé ndi nēmebi iwu.


Chineke, tijie ezé nile ha n'ọnu-ha: Tikwopu ezé uku nile nke umu-ọdum, Jehova.


ndi nānọdu n'etiti ílì, nānọ kwa ọnọdu-abali n'ebe nile echebeworo na nzuzo; ndi nēri anu ezì, ofé nke ihe-árú di iche iche di kwa n'ihe-isi-ite nile ha;


Ma M'gēme ka ndi Moab adọtara n'agha laghachi n'ikpe-azu nke ubọchi nile; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. Rue ebe a bu ikpé Moab.


Ma o gēru, n'ikpe-azu nke ubọchi nile, na M'gēme ka ndi Ilam adọtara n'agha laghachi; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ma emesia M'gēme ka umu Amon adọtara n'agha laghachi; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Otú a ka Jehova siri: Dika onye-ọzùzù-aturu si anaputa ọlu-ukwu abua, ma-ọbu iberibe nti, n'ọnu ọdum; otú a ka agānaputa umu Israel ndi nānọdu ala nime Sameria na nkuku ihe-ndina, na n'elu nkisi ọma nke ebe anēdina.


Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Na mb͕e ahu ka ndikom iri gēsi n'asusu nile nke mba nile jide, ọbuná ijide ọnu-ọnu-ala uwe nwoke bu onye-Ju, si, Ayi na unu gāyikọ je, n'ihi na ayi anuwo na Chineke nọyere unu.


Nwa iko gēbi kwa n'Ashdod, M'gēbipu kwa npako ndi Filistia.


M'gāma-kwa-ra ulom ulo-ikwū, dika ebe-nguzo-ndi-agha, n'ihi onye-ngabiga na n'ihi onye nālata: ka onye nāchi n'ihe-ike we ghara igabiga kwa n'akuku ha ọzọ: n'ihi na ub͕u a ka M'jiworo anyam abua hu.


Onye-Ju ma-ọbu onye-Grik apughi idi, orù ma-ọbu onye nwe onwe-ya apughi idi, nwoke na nwanyi apughi idi: n'ihi na unu onwe-unu nile bu otù onye nime Kraist Jisus.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan