Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Zekaraya 9:5 - Bible Nso

5 Ashkelon gāhu ya, tua egwu; Geza kwa, ọ gāb͕ali kwa nke-uku; Ekron kwa, n'ihi na ihere gēme ntukwasi-obi-ya: eze gālanari kwa Geza n'iyi, madu agaghi-ebi kwa n'Ashkelon.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Ashkelọn ga-ejupụta nʼụjọ mgbe ọ ga-ahụ ihe ndị a ka ha na-eme. Gaza kwa, ga-aṅagharị onwe ya nʼime oke ihe mgbu. Ọ bụladị Ekrọn ga-ama jijiji nʼụjọ mgbe ha hụrụ na olileanya ha agwụla. A ga-anapụ Gaza eze ya ma gbukwaa ya. Ọ dịghị onye ọbụla ga-ebikwa nʼAshkelọn.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Zekaraya 9:5
18 Iomraidhean Croise  

N'arọ ọnwu eze, bú Ehaz, ka ibu a di.


Okwu Jehova nke ruru Jeremaia, bú onye-amuma, nti bayere ndi Filistia, tutu Fero etib͕ue Geza.


Ọzọ kwa, gini ka unu gēmem, unu Taia na Zaidon na buruburu-ala nile nke Filistia? Ọ̀ di nmeso M'mesoworo unu unu onwe-unu nākwughachim, ma ọ̀ bu na ihe di unu onwe-unu nēmesom? M'gēji ngwa na ọsọ nyeghachi nmeso-unu n'isi-unu.


Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke Geza, e, n'ihi anọ, ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n'ihi na ha mere ka otù ndi je biri n'ala ọzọ, ha nile, imechibido ha nye n'aka Edom:


M'gēsi kwa n'Ashdad bipu onye bi ya, si kwa n'Ashkelon bipu onye nējide nkpa-n'aka-eze; M'gēchighari kwa akam imegide Ekron, ndi Filistia ndi fọduru gāla kwa n'iyì; otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri.


Le, Onye-nwe-ayi gānapu ya ala-ya, tikue ike-ya n'oké osimiri, ọ bu kwa ya onwe-ya ka ọku gēripia.


Nwa iko gēbi kwa n'Ashdod, M'gēbipu kwa npako ndi Filistia.


Ma mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi gwara Filip okwu, si, Bilie, nāga n'akuku Ndida rue uzọ nke si na Jerusalem arida rue na Geza: uzọ ahu bu ọhia.


Olile-anya ahu emeghi kwa ka ihere me ayi; n'ihi na awusaworo ihu-n'anya nke Chineke n'obi-ayi site n'aka Mọ Nsọ Nke enyere ayi.


dika olile-anya siri ike na ntukwasi-obi nkem si di, na n'ihe ọ bula ọ dighi ihere gēmem, kama na agēme kwa ka Kraist di uku n'arum ub͕u a, otú ọ di mb͕e nile, ma ọ bu site na ndu, ma-ọbu site n'ọnwu, nime nkwuwa-okwu nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan