Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Zekaraya 9:10 - Bible Nso

10 M'gēbipu kwa ub͕ọ-ala n'Efraim, bipu kwa inyinya na Jerusalem, agēbipu kwa uta agha; Ọ gāgwa kwa mba nile okwu udo:Ọ gāchi kwa achi site n'otù oké osimiri rue oké osimiri ọzọ, site kwa n'Osimiri rue nsọtu nile nke uwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Ọ ga-ewezuga ụgbọ ịnyịnya niile nke Ifrem, na ịnyịnya agha niile nke Jerusalem; a ga-agbajikwa ụta agha. Ọ ga-ewetara mba niile udo, ọchịchị ya ga-esite nʼotu oke osimiri ruo nʼosimiri nke ọzọ, sitekwa nʼOsimiri Yufretis ruo na nsọtụ niile nke ụwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Zekaraya 9:10
33 Iomraidhean Croise  

Solomon we nāchi ala-eze nile site n'Osimiri rue ala ndi Filistia, ru kwa ókè-ala Ijipt: ha nēweta nso onyinye-inata-iru-ọma, nēfè kwa Solomon òfùfè ubọchi nile nke ndu-ya.


Ka aha-Ya dirue mb͕e ebighi-ebi; N'iru anyanwu ka aha-Ya gāmu ọmùmù: Madu gāgọzi kwa onwe-ha nime ya: Mba nile gākpọ ya onye ihe nāgara nke-ọma.


Ugwu nile gēbutere ndi-Gi udo, Ugwu ntà kwa, n'ezi omume.


M'gānu ihe Chineke, bú Jehova, gēkwu: N'ihi na Ọ gāgwa ndi-Ya, gwa kwa ndi-ebere-Ya, okwu udo: Ma ka ha ghara ilaghachi ba n'ihe-nzuzu.


Onye ahu gākpọm, si, Nnam ka I bu, Chinekem, na oké nkume nke nzọputam.


Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na nkpọrọgwu Jesi, nke nēguzo ibu ọkọlọtọ ndi nile di iche iche, ya ka mba nile gāju ase; ebe-izu-ike-ya gābu kwa ebube.


Ọ gēkpe kwa ikpe n'etiti mba nile, dozi-kwa-ra ọtutu ndi di iche iche okwu-ha: ha gākpughari kwa mma-agha-ha nile ka ha buru mma-ọgè, na ube-ha nile ka ha buru mma-ikwa-osisi: mba agaghi-ebuli mma-agha megide mba, ha agaghi-amuta kwa agha ọzọ.


O we si, Ọ bu ihe di kari nfe na i gāburum orù, ime ka ebo nile nke Jekob bilie, na ime ka ndi Israel echebere echebe lata: enyewokwam i ka i buru ìhè nke mba nile, ibu nzọputam rue nsọtu uwa.


N'ihi na mba ahu na ala-eze ahu nke nāgaghi-efè gi gāla n'iyì; e, aghaghi ime ka mba ahu nile tọb͕ọrọ n'efu.


Ma n'aru ulo Juda ka M'gēnwe obi-ebere, M'gēji kwa Jehova, bú Chineke-ha, zọputa ha, ma M'gaghi-eji uta, ma-ọbu mma-agha, ma-ọbu agha, ma-ọbu inyinya, ma-ọbu ndi-inyinya, zọputa ha.


N'ubọchi ahu Mu na anu ọhia na anu-ufe nke elu-igwe na ihe nākpu akpu nke ala gāb͕ara ha ndu: ọ bu kwa uta na mma-agha na agha ka M'gāb͕ajipu n'ala-ha, me ka ha dina ala na ntukwasi-obi.


M'gēkwere kwa ilu gi n'Onwem n'ikwesi-ntukwasi-obi: i we mara, Jehova.


Ma gi onwe-gi, ulo-elu nke ìgwè aturu, Ofel nke ada Zaion, gi ka ọ gābiakute; e, ọchichi anāchi mbu gābia, bú ala-eze nke diri ada Jerusalem.


Ọ gēguzo kwa, zùa ìgwè aturu-ya n'ike nke Jehova, na nbili-elu nke aha Jehova, bú Chineke-ya: ha gēbiri kwa; n'ihi na ub͕u a ka ọ gādi uku rue nsọtu nile nke uwa.


Ka aka-gi di elu imegide ndi nākpab͕u gi, ka ebipu kwa ndi-iro-gi nile.


M'gākwatu kwa oche-eze nke ala-eze nile, M'gēkpochapu kwa ike nke ala-eze nile nke mba nile; M'gākwatu kwa ub͕ọ-ala, na ndi nānọkwasi ha; inyinya na ndi nānọkwasi ha gārida kwa, onye ọ bula site na mma-agha nwa-nne-ya.


Okwu nke O zitere umu Israel, nēzisa ozi ọma nke udo site n'ọnu Jisus Kraist (Onye ahu bu Onye-nwe madu nile)


Ma ihe nile sitere na Chineke, Onye sitere n'aka Kraist me ka ayi na Ya onwe-ya di n'otù, O we nye ayi ije-ozi nke ime-ka-adi-n'otú ahu;


Ya mere ayi bu ndi-ukọ̀ n'ọnọdu Kraist, dika agāsi na Chineke nāriọ aririọ site n'aka-ayi: ayi nọ n'ọnọdu Kraist nāriọ unu, menu ka unu na Chineke di n'otù.


Ebe ọ bula nke ọbu-ukwu-unu gāzọkwasi ka unu gēnwe: site n'ọzara, na Lebanon, site n'osimiri ahu, bú osimiri Yufretis, we rue oké osimiri nke di n'azu, gābu ókè-ala unu.


Mọ-ozi nke-asa we fùa opì; oké olu we da n'elu-igwe, ha we si, Ala-eze nke uwa aghọwo ala-eze nke Onye-nwe-ayi, na nke Kraist-Ya: Ọ gābu kwa eze rue mb͕e nile ebighi-ebi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan