Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Zekaraya 8:7 - Bible Nso

7 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Le, M'gaje izọputa ndim n'ala Ọwuwa-anyanwu, na n'ala Ọdida-anyanwu:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Aga m azọpụta ndị m site na mba niile dị nʼọwụwa anyanwụ na nʼọdịda anyanwụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Zekaraya 8:7
21 Iomraidhean Croise  

ma asi na unu alaghachikutem, we debe ihe nile M'nyere n'iwu me kwa ha, ọ buru na ndi-unu anāchufu adi na nsọtu elu-igwe, site n'ebe ahu ka M'gāchikọta ha, me ka ha biarue ebe ahu nke M'rọputaworo ime ka aham biri n'ebe ahu.


Site n'ọwuwa anyanwu rue ọdida-ya Aha Jehova gābu ihe anēto eto.


Jehova nēwuli Jerausalem elu; Ndi adọtara n'agha nke Israel ka Ọ nāchikọta.


Chineke Nke kachasi chi nile, bú Jehova, ekwuwo, We kpọ uwa site n'ọwuwa anyanwu rue ọdida-ya.


Le, ndia gēsi n'ebe di anya bia: le kwa, ndia gēsi n'Ugwu na n'Ọdida-anyanwu; ndia gēsi kwa n'ala Sainim.


Ha gātu kwa egwu aha Jehova site n'Ọdida-anyanwu, tu kwa egwu ebube-Ya site n'ọwuwa anyanwu: mb͕e onye-nkpab͕u gābata dika miri-iyi, Mọ nke Jehova ganēbuli ọkọlọtọ imegide ya.


Le, M'gaje ime ka ha si n'ala Ugwu bia, M'gāchikọputa kwa ha na nsọtu nile nke uwa, n'etiti ha ka onye-ìsì na onye-ngwurọ na nwanyi di ime na nwanyi ime nēme gānọ n'otù: na nkpọkọta uku ka ha gālata n'ebe a.


N'ihi nka si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: M'gāchikọputa unu nime ndi nile di iche iche, me kwa ka unu si n'ala nile ebe achusaworo unu zukọta, M'gēnye kwa unu ala Israel.


Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ubọchi M'mere ka unu si n'ajọ omume nile unu di ọcha, n'ubọchi ahu ka M'gēme ka madu bi n'obodo nile unu, agēwu kwa ebe nile tọb͕ọrọ n'efu.


M'gēme kwa ka ulo Juda di ike, M'gāzọputa kwa ulo Josef, me ka ha lata, n'ihi na enwerem obi-ebere n'aru ha: ha gādi kwa ka agāsi na achupughm ha-ri: n'ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-ha, M'gāza kwa ha.


N'ihi na site n'ọwuwa anyanwu we rue ọdida-ya aham di uku n'etiti mba nile; ọ bu kwa n'ebe nile ọ bula ka anēweta nso aham ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ na onyinye-inata-iru-ọma di ọcha: n'ihi na aham di uku n'etiti mba nile, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.


na Jehova, bú Chineke-gi, gēme ka ndi-gi adọtara n'agha lata, Ọ gēnwe kwa obi-ebere n'aru gi, laghachi, chikọputa gi nime ndi ahu nile, ebe Jehova, bú Chineke-gi, meworo ka i b͕asa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan