Zekaraya 8:6 - Bible Nso6 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Asi na ọ dikari ike ime n'anya ndi nka fọduru n'ubọchi ahu, ọ̀ bu kwa n'anyam ka ọ gādi kari ike ime? (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta). Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a6 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “O nwere ike bụrụ na ihe ndị a ga-adị ka ihe dịkarịrị ike imezu nʼanya ndị ahụ ga-afọdụ nʼoge ahụ, ma ọ ga-abụ ihe dịkarịrị ike ime nʼanya m?” Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri. Faic an caibideil |