Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Zekaraya 8:5 - Bible Nso

5 Amá nile nke obodo ahu gējuputa kwa n'umu-ntakiri ndikom na umu-ntakiri ndinyom nēgwuri egwú n'amá-ya nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Okporoụzọ nke obodo ahụ niile ga-ejupụtakwa nʼụmụntakịrị ndị nwoke na ndị nwanyị na-egwugharị egwu na ama ebe ahụ.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Zekaraya 8:5
11 Iomraidhean Croise  

Ha gābia kwa, tie nkpu ọṅù n'ebe di elu nke Zaion, rùba dika osimiri rue ezi ihe Jehova, rue ọka, ru kwa manya-vine, ru kwa manu, ru kwa umu ìgwè ewu na aturu na nke ìgwè ehi: nkpuru-obi-ha gādi kwa ka ubi ab͕ara ogige nke dere miri nke-ọma; ha agaghi-eru kwa újú ọzọ ma-ọli.


Mb͕e ahu ka nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke gāṅuri ọṅu n'otite-egwú, umu-okorọbia na ndi-okenye gāṅuri kwa ọṅu n'otù: n'ihi na M'gāb͕anwe oruru-újú-ha n'obi-utọ, kasi kwa ha obi, me ka ha si na nwuta-ha ṅuria ọṅu.


Le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e M'gagha nkpuru madu na nkpuru anumanu n'ulo Israel na n'ulo Juda.


agānu kwa ọzọ olu nke obi-utọ na olu ọṅù, na olu nke nwoke nālu nwunye ọhu na olu nke nwanyi anālu ọhu, na olu nke ndi nāsi, Kelenu Jehova nke usu nile nke ndi-agha, n'ihi na Jehova di nma, n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: na olu nke ndi nēwebata ekele n'ulo Jehova. N'ihi na M'gēme ka ndi ala nka adọtara n'agha lata dika na mbu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Bilie, tie nkpu n'abali, na nmalite nche di iche iche; Wusi obi-gi dika miri na ncherita-iru Onye-nwe-ayi: Chilie aka-gi n'ebe Ọ nọ n'ihi ndu umu-ntakiri-gi, Ndi nāda #mbà n'agu n'isi èsí nile.


si ya, B͕a ọsọ, gwa nwa-okorọbia nka okwu, si, N'obodo di iche iche nēnweghi mb͕idi ka Jerusalem gēbi, site n'iba-uba madu na anumanu di nime ya.


N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ọ bu mb͕e nsọpuru gasiri ka O ziworom jekuru mba nile ndi nākwata unu: n'ihi na onye nēmetu unu aka nēmetu nwa-anya-Ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan