Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Zekaraya 8:4 - Bible Nso

4 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Agadi ndikom na agadi ndinyom gānọdu ala ọzọ n'amá nile nke Jerusalem, onye ọ bula o jide nkpa-n'aka-ya n'aka-ya site n'iba-uba nke ubọchi ndu-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Agadi ndị ikom na agadi ndị inyom ga-anọdụkwa ala ọzọ na mbara ụzọ niile nke Jerusalem, onye ọbụla ga-ejidekwa mkpara nʼaka ya nʼihi ọnụọgụgụ afọ ha gbara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Zekaraya 8:4
12 Iomraidhean Croise  

Job we nwua, buru agadi, ubọchi ndu-ya ju-kwa-ra ya afọ.


I gābia n'ílì n'ezib͕o agadi, Dika obo ọka si ala elu na mb͕e-ya.


ma ọ buru na o bilie, jeghari n'èzí, dabere na nkpa-n'aka-ya, agāgu onye tiri ya n'onye ikpé nāmagh: ọ bu nání na ọ gēnye ya ihe bayere nb͕uru-ya, me kwa ka aru-ya di ike nke-ọma.


Mb͕e ahu ka nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke gāṅuri ọṅu n'otite-egwú, umu-okorọbia na ndi-okenye gāṅuri kwa ọṅu n'otù: n'ihi na M'gāb͕anwe oruru-újú-ha n'obi-utọ, kasi kwa ha obi, me ka ha si na nwuta-ha ṅuria ọṅu.


Juda na obodo-ya nile gēbikọ nime ya n'otù; ndi-ubi, na ndi nāchiri ìgwè aturu-ha bulie ije.


si ya, B͕a ọsọ, gwa nwa-okorọbia nka okwu, si, N'obodo di iche iche nēnweghi mb͕idi ka Jerusalem gēbi, site n'iba-uba madu na anumanu di nime ya.


kama unu abiaruwo ugwu Zaion, na obodo nke Chineke di ndu, bú Jerusalem nke di n'elu-igwe, na ọtutu ndi anāpughi iguta ọnu,


Le, ubọchi nābia, na M'gēbipu ogwe-aka-gi na ogwe-aka ulo nna-gi, na agadi agaghi-adi n'ulo-gi.


I gēlegide kwa onye-nkpab͕u n'ebe-obibim, n'ezi ihe nile nke Chineke gēmere Israel: agadi agaghi-adi kwa n'ulo-gi ubọchi nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan