Zekaraya 8:23 - Bible Nso23 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Na mb͕e ahu ka ndikom iri gēsi n'asusu nile nke mba nile jide, ọbuná ijide ọnu-ọnu-ala uwe nwoke bu onye-Ju, si, Ayi na unu gāyikọ je, n'ihi na ayi anuwo na Chineke nọyere unu. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a23 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Nʼụbọchị ndị ahụ, mmadụ iri, ndị ga-esi na mba dị iche iche, ndị na-asụkwa asụsụ dị iche iche, ga-ejide otu onye Juda aka nʼọnụ ọnụ uwe ya na-asị, ‘Kwere ka anyị soro gị jee, nʼihi na anyị anụla na Chineke nọnyeere unu.’ ” Faic an caibideil |
Otú a ka Jehova siri, Ihe putara na ndọb͕u Ijipt nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, na ọzuzu-ahia nke Etiopia, na ndi Saba, ndi toro ogologo, gāgabigakute gi, ndi i nwere ka ha gābu kwa; gi ka ha gēso n'azu; na nkpọrọ ka ha gāgabiga: ọ bu kwa gi ka ha gākpọ isi ala nye, gi ka ha gēkpere, si, N'ezie nime gi ka Chineke nọ; ọ dighi kwa onye ọzọ di, ọ dighi otù Chineke efu di ma-ọli.