unu echè-kwa-la ihe ọjọ n'obi-unu, onye ọ bula megide ibe-ya; unu ahu-kwa-la ọb͕ub͕a-iyi ugha n'anya: n'ihi na ihe ndia nile bu ihe nke M'kpọworo asì; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Obubu-ọnu nke ọnwa nke-anọ, na obubu-ọnu nke ọnwa nke-ise, na obubu-ọnu nke ọnwa nke-asa, na obubu-ọnu nke ọnwa nke-iri, gāghọrọ ulo Juda obi-utọ na ọṅù, na mb͕e akara àkà di nma; hu-kwa-nu ezi-okwu na udo n'anya.
Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ka aka-unu di ike, unu ndi nānu n'ubọchi ndia okwu ndia n'ọnu ndi-amuma ahu, ndi nọ n'ubọchi mb͕e atọrọ ntọ-ala ulo Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú ulo uku Ya, ka ewe wue ya.
nēnyocha oge ọ bu ma-ọbu aha oge ọ bu, bú nke Mọ nke Kraist Nke si nime ha nēgosi, mb͕e O buru uzọ nāb͕a àmà bayere ahuhu nke Kraist, na ebube nile nke gēso ha.