Zekaraya 8:13 - Bible Nso13 Ọ gēru kwa na, dika unu buri nkọcha n'etiti mba nile, unu ulo Juda na ulo Israel, otú a ka M'gāzọputa unu, unu aburu ngọzi: unu atula egwu, kama ka aka-unu di ike. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a13 Dịka unu bụ Juda na Izrel si bụrụ ihe a na-abụ ọnụ nʼetiti mba dị iche iche, otu a ka m ga-esi zọpụta unu, unu ga-abụkwa ngọzị. Unu atụla ụjọ, kama meenụ ka aka unu sie ike nʼọrụ unu.” Faic an caibideil |
N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri; Dika awukwasiworo iwem na ọnumam n'aru ndi bi na Jerusalem, otú a ka agāwukwasi ọnumam n'aru unu, mb͕e unu batara n'Ijipt: unu gāghọ kwa ihe-ọb͕ub͕a-iyi, na ihe-iju-anya, na ihe-nkọcha, na ihe-ita-uta; ma unu agaghi-ahu kwa ebe a ọzọ.
M'gēwere kwa ndi Juda fọduru, bú ndi doworo iru-ha ibà n'ala Ijipt inọ dika ọbìa n'ebe ahu, agēme kwa ka ha nile gwusia; n'ala Ijipt ka ha gāda; site na mma-agha na site n'oké unwu ka agēme ka ha gwusia: ha gānwu, site n'onye dikarisiri ntà we rue onye dikarisiri uku, site na mma-agha na site n'oké unwu: ha gāghọ kwa ihe-ọb͕ub͕a-iyi, na ihe-iju-anya, na ihe-nkọcha, na ihe-ita-uta.