Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Zekaraya 8:13 - Bible Nso

13 Ọ gēru kwa na, dika unu buri nkọcha n'etiti mba nile, unu ulo Juda na ulo Israel, otú a ka M'gāzọputa unu, unu aburu ngọzi: unu atula egwu, kama ka aka-unu di ike.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Dịka unu bụ Juda na Izrel si bụrụ ihe a na-abụ ọnụ nʼetiti mba dị iche iche, otu a ka m ga-esi zọpụta unu, unu ga-abụkwa ngọzị. Unu atụla ụjọ, kama meenụ ka aka unu sie ike nʼọrụ unu.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Zekaraya 8:13
50 Iomraidhean Croise  

M'gēme kwa ka nkpuru-gi ba uba dika kpakpando nke elu-igwe, M'gēnye kwa nkpuru-gi ala ndia nile; ọ bu kwa na nkpuru-gi ka mba nile nke uwa gāgọzi onwe-ha;


N'ihi olu ita-uta na onye-nkwulu; N'ihi onye-iro na onye nābọ̀ ọ́bọ̀.


Ka aha-Ya dirue mb͕e ebighi-ebi; N'iru anyanwu ka aha-Ya gāmu ọmùmù: Madu gāgọzi kwa onwe-ha nime ya: Mba nile gākpọ ya onye ihe nāgara nke-ọma.


Ayi aghọworo ndi-ab͕ata-obi-ayi ihe-ita-uta, Ghọ-kwa-ra ndi di ayi buruburu ihe-ichì-ọchì na ihe-ikwa-emò.


M'gēme kwa ndi-isi di nsọ ka ha ghara idi nsọ, nye kwa Jekob ka ọ buru ihe ewezugara ka ebibie ya, nye kwa Israel ka ọ buru ihe-nkwulu.


M'gēwere ha nye iburu ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari, iburu ha ihe ọjọ; ibu ihe-ita-uta, na ilu, na ihe-àkùkù, na ihe-nkọcha, n'ebe nile M'gāchusa ha.


bú Jerusalem, na obodo nile nke Juda, na ndi-eze-ya, na ndi-isi-ya, ime ha nkpọnkpọ ebe, na ihe-iju-anya, na ihe-ima-ọsọ, na ihe-nkọcha; dika o si dì ta;


M'gēme kwa ka ulo a di ka Shailo, ọ bu kwa obodo a ka M'gēme ka ọ ghọrọ mba nile nke uwa ihe-nkọcha.


M'gēji kwa mma-agha, ji kwa oké unwu, ji kwa ọria nēfe efe, chuso ha, M'gēwere kwa ha nye iburu ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari, ibu ihe-ọb͕ub͕a-iyi, na ibu ihe-iju-anya, na ibu ihe-ima-ọsọ, na ibu ihe-ita-uta, n'etiti mba nile ebe M'chugaworo ha:


Ì hughi ihe ndi nka kwuworo, si, Ab͕uru abua nke Jehova rọputara, Ọ juworo ha? ọ bu kwa ndim ka ha nēlelì anya, ha we ghara ibu kwa mba n'iru ha ọzọ.


N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri; Dika awukwasiworo iwem na ọnumam n'aru ndi bi na Jerusalem, otú a ka agāwukwasi ọnumam n'aru unu, mb͕e unu batara n'Ijipt: unu gāghọ kwa ihe-ọb͕ub͕a-iyi, na ihe-iju-anya, na ihe-nkọcha, na ihe-ita-uta; ma unu agaghi-ahu kwa ebe a ọzọ.


M'gēwere kwa ndi Juda fọduru, bú ndi doworo iru-ha ibà n'ala Ijipt inọ dika ọbìa n'ebe ahu, agēme kwa ka ha nile gwusia; n'ala Ijipt ka ha gāda; site na mma-agha na site n'oké unwu ka agēme ka ha gwusia: ha gānwu, site n'onye dikarisiri ntà we rue onye dikarisiri uku, site na mma-agha na site n'oké unwu: ha gāghọ kwa ihe-ọb͕ub͕a-iyi, na ihe-iju-anya, na ihe-nkọcha, na ihe-ita-uta.


Jehova apughi kwa inagide kwa ọzọ, n'ihi ihe ọjọ nke omume nile unu, n'ihi ihe-árú nile nke unu meworo; ala-unu we ghọ nkpọnkpọ ebe, na ihe-iju-anya, na ihe-nkọcha, ghara inwe onye-obibi, dika o si di ta.


Wezuganu onwe-unu, ka ha kpọrọ ha òkù, Onye ruru árú! wezuganu onwe-unu, wezuganu onwe-unu, unu emetula aka: Mb͕e ha b͕apuru ha ṅaghari-kwa-ra; madu siri n'etiti mba nile, Ha agaghi-anọ kwa ọnọdu-abali ọzọ n'ebe a.


M'gēme kwa ka ha na ebe nile nke di ugwu ntàm buruburu ghọ ngọzi; M'gēme kwa ka oké miri-ozuzo zo na mb͕e-ya; oké miri-ozuzo nke ngọzi gādi.


O we sim, Nwa nke madu, ọkpukpu ndia, ulo Israel nile ka ha bu: le, ha nāsi, Ọkpukpu-ayi akpọwo nku, olile-anya-ayi alawo kwa n'iyì; ebipusiwo ayi onwe-ayi.


Ọ gābu-kwa-ra mba nile nke di gi buruburu ihe-ita-uta, na ihe-nkwulu, na ihe-idọ-aka-na-nti, na ihe-iju-anya, mb͕e M'gēme ihe nile ekpere n'ikpe nime gi n'iwe, na n'ọnuma, na n'iba-nba nile nke ọnuma: Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo:


E, Israel nile agabigawo iwu-Gi, we wezuga onwe-ha, ka ha we ghara ige olu-Gi nti: ewe wukwasi ayi ọb͕ub͕a-ayi ahu na ọṅuṅu-ayi ahu nke edeworo n'akwukwọ iwu Moses, bú orù Chineke; n'ihi na ayi emehiewo megide Ya.


Ndi Jekob fọduru gādi kwa n'etiti ọtutu ndi di iche iche dika igirigi sitere n'ebe Jehova nọ, dika aburubu-miri n'elu ihe-ọkukú; nke nādighi-ele anya onye ọ bula, nke nādighi-echere kwa umu madu.


N'ubọchi ahu ka agāsi Jerusalem, Atula egwu: gi Zaion, ekwela ka aka-gi abua kuda.


Na mb͕e ahu ka M'gēme ka unu bata, ọ bu kwa na mb͕e ahu ka M'gāchikọta unu: n'ihi na M'gēme ka unu ghọ aha, ghọ kwa otuto n'etiti ndi nile di iche iche nke uwa, mb͕e M'gēme ka ndi-unu adọtara n'agha lata n'anya-unu, ka Jehova siri.


Nkpuru-ọghigha, ọ̀ di n'ọba rue ub͕u a? ọzọ kwa, osisi vine na osisi fig na osisi pomegranate na osisi olive amighi nkpuru; site n'ubọchi ta ka M'ganāgọzi unu.


dika okwu ahu si di nke Mu na unu b͕ara n'ọb͕ub͕a-ndu-mb͕e unu siri n'Ijipt puta, Mọm nēguzo kwa n'etiti unu: unu atula egwu.


M'we si mọ-ozi nke nāgwam okwu, Ìhe ndia bu gini? Ọ we zam, Ndia bu mpi ahu nke sọsaworo Juda na Israel na Jerusalem.


Agēbi kwa nime ya, nwezuga ka ebibie ya agaghi-adi kwa ọzọ; Jerusalem gēbi kwa na ntukwasi-obi.


otú a ka M'zubewo-kwa-ra ọzọ n'ubọchi ndia ime Jerusalem, ime kwa ulo Juda, nma: unu atula egwu.


Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ka aka-unu di ike, unu ndi nānu n'ubọchi ndia okwu ndia n'ọnu ndi-amuma ahu, ndi nọ n'ubọchi mb͕e atọrọ ntọ-ala ulo Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú ulo uku Ya, ka ewe wue ya.


N'ihi na azọworom Onwem Juda ukwu ikwe ya dika uta, uta ahu ka M'mejuworo n'Efraim dika àkú; M'gākpọte kwa umu-gi, Zaion, imegide umu-gi, Jevan, M'gēme kwa gi ka i di ka mma-agha dike.


Nēchenu nche, nēguzosinu ike n'okwukwe-unu, burunu ndikom, nādinu ike.


ka ngọzi nke Abraham we rue ndi mba ọzọ nime Kraist Jisus; ka ayi we site n'okwukwe ahu nara nkwa Nke bu Mọ Nsọ.


na Ọ gēme kwa gi ka i kachasia mba nile O meworo elu, ibu otuto, ibu kwa aha, ibu kwa ihe mara nma; ka i we buru-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, ndi nsọ, dika O kwuworo.


I gāghọ kwa ihe-iju-anya, na ilu, na ihe-àkùkù, n'etiti ndi ahu nile ebe Jehova gēdu gi je.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan