Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Zekaraya 8:10 - Bible Nso

10 N'ihi na tutu ubọchi nile ahu ugwọ-ọlu madu adighi, ugwọ-ọlu anumanu adighi kwa; ọ dighi kwa udo diri onye nāpu apu ma-ọbu onye nābata abata site n'onye-nkpab͕u: eziga-kwa-ram madu nile, onye ọ bula imegide ibe-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Tupu ụbọchị ahụ, akwụbeghị ma ndị mmadụ ma ụmụ anụmanụ ụgwọ ọrụ ha. Ọ dịghịkwa udo dịrị onye ọbụla na-apụ apụ maọbụ onye na-abata abata nʼihi ndị iro ya, ebe m mere ka onye ọbụla bụrụ onye na-emegide ibe ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Zekaraya 8:10
11 Iomraidhean Croise  

M'gākwali kwa Ijipt megide Ijipt: ha gēbu kwa agha, onye ọ bula megide nwa-nne-ya, onye ọ bula megide kwa ibe-ya, obodo megide obodo, ala-eze megide ala-eze.


Le, M'gaje iziga kpọ ọtutu ndi-ọ́kù, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ha gākùru ha; emesia M'gēziga kpọ ọtutu ndi-ntá, gēsi n'elu ugwu ọ bula, na n'elu ugwu ntà ọ bula, na nime nb͕awa nkume nile di elu, chu ntá ha.


Àgāfù opì-ike n'obodo, ndi-ya aghara ima jijiji? ihe ọjọ, ọ̀ gādi n'obodo, ma Jehova emeghi ya?


Ọ buru kwa na ha ala nime ndọta-n'agha n'iru ndi-iro-ha, site n'ebe ahu ka M'gēnye mma-agha iwu, o we b͕ue ha: M'gātukwasi kwa ha anyam abua ime ha ihe ọjọ, ọ bughi ime ha ezi ihe.


Ma ub͕u a, biko, tukwasinu obi-unu na mb͕e a site n'ubọchi ta laghachi azu, site na mb͕e akātukwasighi nkume n'elu nkume n'ulo uku Jehova:


N'ebe dipuru anya n'olu ndi-uta, n'etiti ebe isere miri, N'ebe aku ka ha gākọ akukọ ezi omume nile nke Jehova, Bú ezi omume nile O mere obodo ntà Ya n'Israel. Mb͕e ahu ndi Jehova ridara rue ọnu-uzọ-ama nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan