Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Zekaraya 7:9 - Bible Nso

9 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha kwuru, si, Kpenu ikpe ezi-okwu, nwe-kwa-nu ebere na obi-ebere nile, onye ọ bula n'aru nwa-nne-ya:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Kpeenụ ikpe ziri ezi, meerenụ ibe unu ebere, ma gosikwa ibe unu ọmịiko.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Zekaraya 7:9
30 Iomraidhean Croise  

Devid we si ya, Atula egwu; n'ihi na aghaghm imere gi ebere n'ihi Jonatan, bú nna-gi, m'gēweghachi-kwa-ra gi ubi nile nke Sọl nna-gi; gi onwe-gi gēri kwa nri na table nkem mb͕e nile.


Ọ buru na úkwù-ya agọzighm, Ọ buru kwa na esiteghi n'aji aturum me ka aru di ya ọku;


Onye obi nālọ ya miri kwesiri inwe ebere site n'aka eyì-ya; Bú onye nārapu kwa egwu Onye Nke puru ime ihe nile.


Ime ezi omume na ihe ekpere n'ikpe Bu ihe Jehova nārọputa kari àjà.


unu ulo Devid, otú a ka Jehova siri, Kpenu ikpe n'ututu, naputa-kwa-nu onye anapuworo ihe n'ike n'aka onye-nmeb͕u, ka ọnumam we ghara ipu dika ọku, ghara kwa ire ere nke ọ nādighi onye ganēmenyu ya, n'ihi ihe ọjọ nke omume nile unu.


Otú a ka Jehova siri: Menu ihe ekpere n'ikpe na ezi omume, naputa-kwa-nu onye anapuworo ihe n'ike n'aka onye-nmeb͕u: unu emejọ-kwa-la ọbìa, ma-ọbu nwa-nb͕ei, ma-ọbu nwanyi di-ya nwuru, unu emela ha ihe-ike, unu awusi-kwa-la ọbara nēmeghi ihe ọjọ n'ebe a.


kama ọ bu okwu a ka M'nyere ha n'iwu, si, Genu nti olum, M'gābu-kwa-ra unu Chineke, unu onwe-unu gābu-kwa-ram otù ndi: je-kwa-nu ije n'uzọ nile nke M'nēnye unu n'iwu, ka o we diri unu nma.


N'ihi na ọ buru na unu eme ka uzọ nile unu na omume nile unu dizue nma; ọ buru na unu emezue ihe ekpere n'ikpe n'etiti otù onye na ibe-ya;


nke nādighēnye ego ka ọ nara uma, nke nādighi-anara ọmuru-nwa, nke nēsi n'ajọ omume seghachi aka-ya, nke nēme ihe ekpere n'ezi-okwu n'etiti madu na madu,


Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: O zuwo unu, unu ndi-isi Israel: wezuganu ime-ihe-ike na ipunara-madu-ihe, menu ihe ekpere n'ikpe na ezi omume; wepunu nchupu-unu nile n'aru ndim; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


Kenean! n'aka-ya ka ihe-ọtùtù aghughọ di: ọ huru imeb͕u emeb͕u n'anya.


Unu emela ajọ omume n'ikpé: ahụla onye nēnweghi ike ikpemara iru ọma, asọpuru-kwa-la iru nke onye uku: n'ezi omume ka i gēkpe madu-ibe-gi ikpe.


Ma ka ikpé ziri ezi nērùdasi ike dika miri, ezi omume kwa dika miri-iyi nke nērù mb͕e dum.


Gi madu, O gosiwo gi ihe di nma; ọ̀ bu kwa gini ka Jehova nāchọ n'aka-gi, ma-ọbughi nání ime ihe ekpere n'ikpe, na ihu ebere n'anya, na iji obi-ume-ala soro Chineke-gi nēje ije?


Ùnu agaghi-anu okwu nile nke Jehova kpọsaworo site n'aka ndi-amuma mbu, mb͕e Jerusalem bu ebe madu bi, mb͕e ọ nọ kwa n'udo, mb͕e madu bi kwa n'obodo-ya nile di ya buruburu na nime Negeb na n'ebe di ala ala?


Okwu Jehova we rue Zekaraia nti, si,


Ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n'ihi na unu nēnye otù uzọ n'uzọ iri nke nkpa-akwukwọ nēsì ísì utọ na anise na cummin, unu arapuwo kwa ihe ka arọ́ n'iwu, bú ikpé, na ebere, na okwukwe: ma ọ di nkpà ka unu me ihe ndia, ka unu ghara kwa irapu ihe ahu.


Ma ahuhu gādiri unu ndi-Farisi; n'ihi na unu nēnye otù uzọ n'uzọ iri nke nkpa-akwukwọ nēsi ísì utọ na rue na nkpa-akwukwọ nile, ma unu nagabiga ikpé na ihu-n'anya Chineke: ma ọ di nkpà ka unu me ihe ndia, ka unu ghara kwa irapu ihe ahu.


Unu elela iru kpe ikpé, kama nēkpenu ikpé ziri ezi.


Ìwu-ayi nēkpe madu ikpé, ọ buru na o bughi uzọ nu n'ọnu-ya, we mara ihe ọ nēme?


I gaghi-ahu ehi nwa-nne-gi, ma-ọbu aturu-ya, nke nāchọ ifu efu, we zopu onwe-gi n'ebe ha di: i ghaghi iwere ha nyeghachi nwa-nne-gi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan