N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, gēziga ọtita-aru n'etiti ndi-ya mara abuba: ọ bu kwa n'okpuru nsọpuru-ya ka agāmuye nmuye dika nmuye nke ọku.
na igwa ndi-nchu-àjà ndi diri ulo Jehova nke usu nile nke ndi-agha okwu, ha na ndi-amuma, si, M'gākwa ákwá n'ọnwa nke-ise, nēkewaputa onwem, dika m'meworo otutu aro ra ka ndia?
Gwa ndi nile nke ala nka, gwa kwa ndi-nchu-àjà, okwu, si, Mb͕e unu buru ọnu, mb͕e unu tiri aka n'obi n'ọnwa nke-ise, na n'ọnwa nke-asa, ọbuná ọgu arọ atọ na iri ndia, ọ̀ bu obubu-ọnu unu buru ma-ọli nye Mu onwem?