Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Zekaraya 6:11 - Bible Nso

11 e, nara ọla-ọcha na ọla-edo, kpua okpu-eze, kpube n'isi Joshua nwa Jehozadak, bú onye-isi-nchu-àjà;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Jiri ọlaọcha na ọlaedo ahụ kpụọ otu okpueze, were ya kpukwasị Joshua nwa Jehozadak bụ onyeisi nchụaja nʼisi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Zekaraya 6:11
18 Iomraidhean Croise  

O we kpupu okpu-eze nke eze-ha n'isi-ya; ọtùtù-ya bu otù talent ọla-edo, nkume di oké ọnu-ahia di kwa ya; o we di n'isi Devid. O weputa-kwa-ra ihe-nkwata obodo ahu, nke riri nne nke-uku.


Ewe chọta ufọdu n'etiti umu ndi-nchu-àjà ndi lutaworo ndinyom ala ọzọ: bú, n'etiti umu Jeshua, nwa Jozadak, na umu-nne-ya: Maaseia, na Elieza, na Jarib, na Gedalaia.


Jeshua nwa Jozadak, na umu-nne-ya, bú ndi-nchu-àjà, na Zerubabel nwa Shealtiel, na umu-nne-ya, we bilie, wue ebe-ichu-àjà Chineke Israel, isure àjà-nsure-ọku n'elu ya, dika edeworo ya n'iwu Moses, bú onye nke Chineke.


N'ihi na I ji ngọzi nke ọdi-nma zute ya: I nātukwasi okpu-eze nke ọla-edo anuchara anucha n'isi-ya.


i gēkpukwasi kwa akwa nkechi ahu n'isi-ya, tiye okpu nsọ nke onye-nchu-àjà n'elu ákwà-nkukù-isi ahu.


Ha mekwara ihe di mbara nke okpu nsọ ahu nke onye-nchu-àjà, ọ bu ọla-edo anāgwaghi agwa, ha de ihe-odide n'elu ya, dika eb͕ub͕u nb͕a-aka-akàrà, IHE NSỌ JEHOVA NWERE.


Puanu, umu-ndinyom Zaion, lekwasi Solomon, bú eze, anya, Ka o kpuru okpu-eze nke nne-ya kpubeworo ya n'ubọchi ọlulu-nwunye-ya, Na n'ubọchi ọṅù nke obi-ya.


Ọ tukwasi ákwà-nkukù-isi n'isi-ya; tukwasi kwa n'ákwà-nkukù-isi ahu, n'iru ya, ihe ahu di mbara nke ọla-edo, bú okpu nsọ nke onye-nchu-àjà; dika Jehova nyere Moses iwu.


N'arọ nke-abua nke Daraiọs, bú eze, n'ọnwa nke-isi, n'ubọchi mbu n'ọnwa, ka okwu Jehova si n'aka Hagai, bú onye-amuma, rue Zerubabel nwa Shealtiel, bú onye nāchi ala Juda, ru kwa Joshua nwa Jehozadak, bú onye-isi-nchu-àjà, nti, si,


Jehova we kpọte mọ Zerubabel nwa Shealtiel, bú onye nāchi ala Juda, na mọ Joshua nwa Jehozadak, bú onye-isi-nchu-àjà, na mọ nke ndi Israel nile fọduru; ha we bia je ozi n'ulo Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke-ha,


Ma ub͕u a, di ike, Zerubabel, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); di ike, Joshua, nwa Jehozadak, bú onye-isi-nchu-àjà; di ike, unu ndi nile nke ala nka, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), luanu ọlu: n'ihi na Mu onwem nọyere unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta),


Ọ we me ka m'hu Joshua, bú onye-isi-nchu-àjà, ka ọ nēguzo n'iru mọ-ozi nke Jehova, na Setan, ka o nēguzo n'aka-nri-ya imegide ya.


M'we si, Ka ha kukùa ákwà-nkukù-isi nwuru enwu n'isi-ya. Ha we kee akwa nkechi-isi nwuru enwu n'isi-ya, yibe ya uwe; mọ-ozi Jehova nēguzo kwa n'ebe ahu.


Okpu-eze ahu gādiri Hilem, di-kwa-ra Tobaija, di-kwa-ra Jedaia, di-kwa-ra Hen nwa Zefanaia, ibu ihe-ncheta n'ulo uku Jehova.


Ma Onye ahu Nke emere Ya ka ọ di kari ndi-mọ-ozi ala nke-ntà, bú Jisus, Ya ka ayi nēle anya, na ejiwo ebube na nsọpuru kpube Ya n'isi dika okpu-eze n'ihi ahuhu nke ọnwu, ka O we site n'amara Chineke detu ọnwu ire n'ihi madu nile ọ bula.


Anya-Ya abua buru kwa ire ọku, Ọ nēkpu kwa ọtutu okpu-eze n'isi-Ya; O nwe-kwa-ra aha edeworo, nke ọ nādighi onye ọ bula matara, ma-ọbughi Ya onwe-ya.


M'we hu, ma le, inyinya ọcha, Onye nānọkwasi ya nwe-kwa-ra uta; ewe nye Ya okpu-eze: O we puta nēmeri, ya na ka O we meri.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan