10 M'we si mọ-ozi ahu nke nāgwam okwu, Òle ebe ka ndia nēbuga ephah ahu?
10 Ajụrụ m mmụọ ozi ahụ na-agwa m okwu, “Ebee ka ha bu nkata ahụ na-aga?”
M'we si, Òle ebe gi onwe-gi nēje? Ọ sim, Itù Jerusalem, ihu ka obosara-ya ra, na ka ogologo-ya ra.
O we sim, Iwuru ya ulo n'ala Shaina: mb͕e edozisiri ya, agādọba ya n'ebe ahu n'ihe-ndọkwasi-ya.
M'we welie anyam abua, hu, ma le, ndinyom abua nāputa, ifufe di kwa na nkù-ha, n'ihi na ha nwere nkù abua dika nkù ub͕ala: ha we bulie ephah ahu n'etiti ala na elu-igwe.
M'we za, si mọ-ozi ahu nke nāgwam okwu, Gini bu ndia, onye-nwem?