1 M'we welie anyam abua ọzọ, hu, ma le, akwukwọ-npiakọta nke nēfe efe.
1 Ọzọkwa, eleliri m anya elu, ma hụ akwụkwọ a fụkọrọ afụkọ nke na-efegharị efegharị.
Jehova we sim, Were n'onwe-gi otù oké mbadamba ihe, ji kwa ihe madu ji ede ihe-odide dekwasi ya, Nka diri Maha-shalal-hash-baz;
O we sim, Gini ka gi onwe-gi nāhu? M'we za, Mu onwem nāhu akwukwọ-npiakọta nēfe efe; ogologo-ya di orú cubit, obosara-ya di kwa cubit iri.
ọ nējide kwa nwa akwukwọ ntà n'aka-ya, nke asagheworo: o we tukwasi ukwu aka-nri ya n'elu oké osimiri tukwasi kwa ukwu aka-ekpe ya n'elu ala;