Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Zekaraya 4:10 - Bible Nso

10 N'ihi na ònye ledaworo ubọchi ihe ntà anya? n'ihi na ha gāṅuri ọṅu, hu nkume eji atù mb͕idi n'aka Zerubabel, bú asa ndia, ndi bu anya Jehova; ndi ahu nējeghari n'uwa nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 “Onye na-eleda ụbọchị ihe nta anya ebe ọ bụ nʼanya asaa nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ejegharị na-elezu ụwa dum, ga-aṅụ ọṅụ mgbe ha hụrụ nkume eji atụ mgbidi nʼaka Zerubabel?”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Zekaraya 4:10
26 Iomraidhean Croise  

N'ihi na Jehova, anya-Ya nējeghari n'uwa nile, igosi Onwe-ya onye di ike n'akuku ndi obi-ha zuru okè n'ebe Ọ nọ. I bu onye-nzuzu na nka; n'ihi na site n'ub͕u a i gēnwe agha.


Ọ bu ezie na nmalite-gi di ntà, Ma ikpe-azu-gi gēbù ibù nke-uku.


Ọ siwo n'ọnọdu ebe-obibi-Ya Lekwasi ndi nile bi n'uwa anya;


N'ebe nile ọ bula ka anya abua nke Jehova di, Nēche ndi ọjọ na ndi bu ezi madu nche.


Ma okporo-uzọ ndi ezi omume di ka ìhè nēnwu enwu, Nke nāmu aga n'iru n'iru rue mb͕e chi bọchara.


ka unu we ṅujue ara nkasi-obi-ya nile afọ; ka unu we miputa ara, njubiga-ókè nke nsọpuru-ya ewe tọ unu utọ.


Unu gāhu kwa ya, o we tọ obi-unu utọ, ọkpukpu nile unu gējuputa na ndu dika ahihia ndu: agāma kwa aka Jehova n'ebe ndi-orù-Ya nọ, Ọ gēwesa kwa ndi-iro-Ya iwe.


N'ihi na anyam abua dikwasi n'uzọ nile ha: ezopughi ha n'irum, ezobeghi kwa ajọ omume-ha pua n'iru anyam abua.


Ihe anọ ahu di ndu nāb͕a ọsọ nālaghachi kwa dika ob͕ub͕u-àmùmà si di n'ile ya anya.


Ka ayi mara kwa, ka ayi b͕aso imara Jehova; dika chi-ọbubọ, otú a ka ọpupu-Ya guzosiworo ike: Ọ gābiakute kwa ayi dika oké miri-ozuzo, dika miri-ozuzo ikpe-azu nke nēzosa ala.


O rue, mb͕e ha ripiasiri ihe-ọkukú nile nke ala, na m'siri, Onye-nwe-ayi Jehova, biko, b͕aghara: Jekob, ò gēsi aṅa guzosie ike? n'ihi na onye ntà ka ọ bu.


M'we si, Onye-nwe-ayi Jehova, biko, rapu: Jekob, ò gēsi aṅa guzosie ike? n'ihi na onye ntà ka ọ bu.


Ònye fọduru n'etiti unu nke huru ulo a n'ebube mbu ya? ọ̀ di kwa aṅa n'anya-unu onwe-unu ub͕u a? ọ̀ dighi nání ka ihe-efu n'anya-unu?


N'ihi na, le, nkume ahu nke M'tiyeworo n'iru Joshua; n'elu otù nkume ka anya asa di: le, M'gēb͕u eb͕ub͕u-ya, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), M'gēbupu kwa ajọ omume ala ahu n'otù ubọchi.


Ibu okwu Jehova nke eboro ala Hadrak, Damaskọs gābu kwa ebe-izu-ike-ya: n'ihi na n'ebe Jehova nọ ka anya madu na nke mba nile nke Israel di:


Ma ayi aghaghi ime ka obi tọ ayi utọ na iṅuri ọṅu: n'ihi na nwa-nne-gi nka nwururi anwu, o we di ndu ọzọ; o fukwara efu, ewe hu ya.


M'we hu Nwa-aturu ka O nēguzo n'etiti oche-eze ahu na ihe anọ ahu nke di ndu, guzo kwa n'etiti ndi-okenye ahu, dika agāsi na eb͕uru Ya-ri, O nwe-kwa-ra mpi asa, na anya asa, nke bu Mọ asa ahu nke Chineke, bú nke ezigaworo ha n'uwa nile.


M'we hu ndi-mọ-ozi asa ahu ndi nēguzo n'iru Chineke; ewe nye ha opì asa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan