Zekaraya 3:4 - Bible Nso4 O we za, gwa ndi nēguzo n'iru ya okwu, si, Chizuga uwe rusiri inyi n'aru ya. O we si ya, Le, emewom ka ajọ omume-gi si n'aru gi gabiga, M'gēyibe kwa gi uwe ememe. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a4 Mmụọ ozi ahụ gwara ndị ahụ guzo ya nʼihu, “Yipụnụ ya uwe a ruru unyi.” Mgbe ahụ, ọ gwara ya okwu sị, “Lee, ewepụla m mmehie gị, ma ugbu a, aga m eyikwasị gị uwe mmemme ndị a.” Faic an caibideil |
Obi gātọm utọ nke-uku nime Jehova, nkpuru-obim gēteghari egwú ọṅù nime Chinekem; n'ihi na Ọ chiriwo uwe nzọputa yikwasim, O werewo uwe-nwuda ezi omume kpuchiem, dika onye nālu nwunye ọhu si ewere ihe ọma ike n'isi ke onwe-ya dika onye-nchu-àjà, na dika nwanyi anālu ọhu si ewere ihe-ejiji-ya nile chọ onwe-ya nma.