Zekaraya 2:10 - Bible Nso10 Tie nkpu ọṅù, ṅuria, gi ada Zaion: n'ihi na, le, Mu nābia, M'gēbi kwa n'etiti gi; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a10 “Tie mkpu ọṅụ, ka obi tọkwaa gị ụtọ, gị Ada Zayọn. Nʼihi na ana m abịa ibi nʼetiti gị,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. Faic an caibideil |
Obi gātọm utọ nke-uku nime Jehova, nkpuru-obim gēteghari egwú ọṅù nime Chinekem; n'ihi na Ọ chiriwo uwe nzọputa yikwasim, O werewo uwe-nwuda ezi omume kpuchiem, dika onye nālu nwunye ọhu si ewere ihe ọma ike n'isi ke onwe-ya dika onye-nchu-àjà, na dika nwanyi anālu ọhu si ewere ihe-ejiji-ya nile chọ onwe-ya nma.
agānu kwa ọzọ olu nke obi-utọ na olu ọṅù, na olu nke nwoke nālu nwunye ọhu na olu nke nwanyi anālu ọhu, na olu nke ndi nāsi, Kelenu Jehova nke usu nile nke ndi-agha, n'ihi na Jehova di nma, n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: na olu nke ndi nēwebata ekele n'ulo Jehova. N'ihi na M'gēme ka ndi ala nka adọtara n'agha lata dika na mbu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.