Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Zekaraya 14:12 - Bible Nso

12 Nka gābu kwa ihe-otiti nke Jehova gēji ti ndi nile di iche iche ndi busoworo Jerusalem agha: anu-aru-ha nile n'otù n'otù gātasi ata mb͕e ha onwe-ha nēguzo n'ukwu-ha, anya-ha gātasi kwa ata n'oghere-ha, ire-ha gātasi kwa ata n'ọnu-ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Nke a bụ ọrịa ọjọọ nke Onyenwe anyị ga-eji kụda mba niile buru agha megide Jerusalem. Anụ ahụ ha ga-ere ure mgbe ha ka guzo ọtọ. Anya ha ga-erekwa ure, ire ha ga-erekwa ure nʼọnụ ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Zekaraya 14:12
34 Iomraidhean Croise  

gi onwe-gi kwa, O gēji ọtutu ọria, n'ọria ngiri-afọ-gi, tie gi, rue mb͕e ngiri-afọ-gi gāputa site n'ọria ahu kwa-ubọchi.


Ọ gēripia ihe di n'akpukpọ-aru-ya, Ọkpara ọnwu gēripia ihe nile di ya n'aru.


Ònye mara ike nke iwe-Gi, Na nrubiga-ókè nke iwe-Gi dika egwu nke kwesiri Gi si di?


Mu onwem gēme kwa unu nka; M'gēme obi-ọlulọ-miri ka ọ buru onye-nlekọta-unu, bú ọtita-aru na aru-ọku, nēme ka anya-unu hubìe uzọ, nēme kwa ka nkpuru-obi-unu b͕azepu: unu gāgha kwa nkpuru-unu n'efu, ndi-iro-unu gēri kwa ya.


Ma ọ buru na unu agaghi-egem nti rue ihe ndia, M'gādọ kwa unu aka na nti ub͕ò asa ọzọ n'ihi nmehie nile unu.


Ma ọ buru na unu ejeghari n'imegidem, we ghara ikwe igem nti; M'gātukwasi kwa unu ihe-otiti ub͕ò asa ọzọ dika nmehie-unu nile si di.


Mu onwem gējeghari kwa n'imegide unu; M'gēti kwa unu ihe ub͕ò asa, ọbuná Mu onwem, n'ihi nmehie nile unu.


M'gējeghari kwa n'imegide unu n'ọnuma; M'gādọ kwa unu aka na nti ub͕ò asa, ọbuná Mu onwem, n'ihi nmehie nile unu.


Ọ bu kwa iwe uku ka Mu onwem nēwesa mba nile ndi nọ jū: n'ihi na Mu onwem were iwe nke-ntà, ma ha onwe-ha yere aka ime ha ihe ọjọ.


Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na M'gāchọ ikpochapu mba nile ndi nābia imegide Jerusalem.


Otú a ka ihe-otiti nke inyinya na inyinya mule na camel na inyinya-ibu na anumanu ọ bula nke gādi n'ulo-ikwū ndia gādi, dika ihe-otiti a.


Ọ buru kwa na ab͕uru Ijipt adighi-arigobata, ọ̀ gaghi-adi n'aru ha, bú ihe-otiti, nke Jehova gēji ti mba nile ndi nādighi-arigo ime ememe ulo-ntu?


Jehova gāpu kwa, buso mba ahu nile agha, dika n'ubọchi O buru agha n'ubọchi ilu-ọ̀gù.


si ya, B͕a ọsọ, gwa nwa-okorọbia nka okwu, si, N'obodo di iche iche nēnweghi mb͕idi ka Jerusalem gēbi, site n'iba-uba madu na anumanu di nime ya.


Ngwa ngwa mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi we tie ya ihe, n'ihi na ọ nyeghi Chineke otuto ahu: ikpuru we tab͕ue ya, o we kubìe ume.


Jehova gēme ka ajọ ọria nke nēfe efe rapara n'aru-gi, rue mb͕e Ọ gēme ka i gwupu n'elu ala ahu, ebe gi onwe-gi nābà inweta ya.


Jehova gēwere ọtita-aru, were kwa aru-ọku, were kwa nruru-ọku, were kwa oké okpom-ọku, were kwa mma-agha, were kwa nchakpọ, were kwa ọmuma-ebù, tib͕ue gi; ha gāchu kwa gi rue mb͕e i gāla n'iyì.


Jehova gēme kwa ka ihe-otiti-gi nile na ihe-otiti nile nke nkpuru-gi di ebube, ha gābu ihe-otiti uku, nke nānọgide kwa anọgide, na ọria ọjọ, nke nānọgide kwa anọgide.


Mpi iri ahu i huru, ha na anu-ọhia ahu, ndia gākpọ nwanyi ahu nākwa iko asì, ha gēme kwa ya ka ọ buru onye tọb͕ọrọ n'efu buru kwa onye b͕a ọtọ, ha gēri kwa anu-aru-ya, rechapu kwa ya n'ọku.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan