Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Zekaraya 12:5 - Bible Nso

5 Ndi-isi nke usu nile nke nnù madu abua na ọgu iri nke Juda gāsi kwa n'obi-ha, Ume m'nwere ka ndi bi na Jerusalem gābu nime Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke-ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Mgbe ahụ, ndị ndu Juda ga-ekwu nʼobi ha sị, ‘Ndị Jerusalem achọtala ike nʼihi na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke ha.’

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Zekaraya 12:5
28 Iomraidhean Croise  

Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú oké nkumem, bu, Onye nēzí akam abua ilu ọ̀gù: Onye nēzí nkpisi-akam ibu agha:


Ọ bu Chineke Nke ji ike kem dika ihe-ọkiké, Ọ nēme kwa ka uzọm zue okè.


I nēji kwa ike kem dika ihe-ọkiké ibu agha: I nēme ka ndi nēbili imegidem ruru ala n'okpurum.


Chineke buru ayi ebe-nb͕abà na ike, O mewo ka achọta Ya n'iye aka nke-uku na nkpab͕u nile.


Nurunu okwu Jehova, unu ndi-ikpe Sọdọm; ṅanu nti n'iwu Chineke-ayi, unu ndi Gọmọra.


Ndi-isi-gi nēwezuga onwe-ha n'ebe M'nọ, ha bu kwa ndi ejikọtara ha na ndi-ori; onye ọ bula nime ha nāhu iri-ngo n'anya, nāb͕aso kwa ihe-nkwughachi: ọ dighi nwa-nb͕ei ha nēkpe ikpe ziri ezi, okwu-ikpe nke nwanyi di-ya nwuru adighi-abiakute kwa ha.


M'gēme kwa ka ndi-ikpe-gi laghachi dika na mbu, M'gēme kwa ka ndi nādu gi ọdu laghachi dika na nmalite: emesia agākpọ gi Obodo ezi omume, obodo nke kwesiri ntukwasi-obi.


N'ubọchi ahu Jehova nke usu nile nke ndi-agha gāghọrọ ndi-Ya fọduru okpu-eze nke mara nma, na okpu ọma nke ima-nma:


Ọ gāghọ-kwa-ra onye nānọkwasi n'oche ikpé mọ nke ikpé, Ọ gāghọ-kwa-ra ndi nāchughachi ndi nēbu agha rue ọnu-uzọ-ama idi-ike.


N'ihi na Jehova awukwasiwo unu mọ nke oké ura, we mechisie anya-unu ike, bú ndi-amuma; isi-unu, bú ndi-ọhù, ka O kpuchiwo-kwa-ra.


Le, n'ezi omume ka otù eze gābu eze, ndi-isi kwa, n'ikpé ziri ezi ka ha gābu ndi-isi.


Nání na Jehova ka ezi omume nile na ike di, (mu ka agwara okwu a): Ya ka madu gābiakute, ihere gēme kwa ndi ahu nile iwe-ha di ọku megide Ya.


N'ọnọdu ọla M'gēweta ọla-edo, n'ọnọdu ígwè M'gēweta ọla-ọcha, n'ọnọdu osisi M'gēweta ọla, n'ọnọdu nkume M'gēweta ígwè: M'gēme kwa ka ndi-nlekọta-gi ghọ udo, M'gēme kwa ka ndi nāchi gi n'ihe-ike ghọ ezi omume.


Ọzọ, onye-ebube nke Jekob gābu onye sitere na ya, onye nāchi ya gēsi kwa n'etiti ya puta; M'gēme kwa ka ọ biarue nso, o we biakutem nso: n'ihi na ònye ka onye a bu nke nọworo obi-ya mbé ibiakutem nso? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


ya bu na M'gāju nkpuru Jekob, na Devid, bú orùm, M'we ghara isi na nkpuru-ya were ndi ganāchi nkpuru nke Abraham na Aisak na Jekob: n'ihi na M'gēme ka ndi-ha adọtara n'agha lata, M'gēnwe kwa obi-ebere n'aru ha.


Jehova gēsi kwa na Zaion bib͕ọ, me ka olu-Ya si na Jerusalem da; elu-igwe na uwa gēme kwa nkpatu: ma Jehova gāburu ndi-Ya ebe-nb͕abà, Ọ gābu-kwa-ra umu Israel ebe siri ike.


M'gēme kwa ka ha di ike nime Jehova; ọ bu kwa n'aha-Ya ka ha ganējeghari; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


M'gēme kwa ka ulo Juda di ike, M'gāzọputa kwa ulo Josef, me ka ha lata, n'ihi na enwerem obi-ebere n'aru ha: ha gādi kwa ka agāsi na achupughm ha-ri: n'ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-ha, M'gāza kwa ha.


N'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), M'gēji ibobo tib͕ue inyinya ọ bula, ji kwa ara-ọwiwi tib͕ue onye nānọkwasi ya: ọ bu kwa ulo Juda ka M'gāsaghe anyam abua lekwasi, ọ bu inyinya nile ọ bula nke ndi nile di iche iche ka M'gēji ikpu-ìsì tib͕ue.


N'ubọchi ahu ka M'gēme ka ndi-isi nke usu nile nke nnù madu abua na ọgu iri nke Juda di ka ihe igu ọku n'etiti nkú, na dika ọwa nēnwu ọku n'etiti ùkwù-ọka; ha gēripia kwa ndi nile di iche iche di ha buruburu n'aka-nri na n'aka-ekpe: Jerusalem gēbi kwa ọzọ n'onodu-ya, obuná nime Jerusalem.


Ọzọ, Juda gēbuso kwa Jerusalem agha; agēkpokọta kwa àkù mba nile di buruburu, bú ọla-edo na ọla-ọcha na uwe bara uba nke-uku.


Obim di n'ebe ndi-ònyé-ukpuru nke Israel nọ, Ndi nēwere afọ-ofufo nye onwe-ha n'etiti ndi Israel: Gọzienu Jehova.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan