Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Zekaraya 11:6 - Bible Nso

6 N'ihi na M'gaghi-enwe kwa ọmiko ọzọ n'aru ndi bi n'ala nka, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): ma, le, Mu onwem gaje irara madu ndia nye, onye ọ bula n'aka ibe-ya na n'aka eze-ya: ha gētib͕u kwa ala nka, M'gaghi-anaputa kwa ha n'aka-ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Nʼihi na mụ onwe m agakwaghị egosi ndị ala a obi ebere.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. “Aga m ewere onye ọbụla nʼime ha nyefee nʼaka onye agbataobi ya, na nʼaka eze ha. Ha ga-ebibi ala a kpamkpam, ma mụ onwe m agaghị anapụta onye ọbụla site nʼaka ha.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Zekaraya 11:6
37 Iomraidhean Croise  

Biko, ghọtanu nka, unu ndi nēchezọ Chineke, Ka m'we ghara idọka unu, ọ dighi kwa onye-nnaputa diri unu:


Mb͕e ngalaba-ya kpọnwuru akpọnwu, agānyajipu ha; ndinyom abia sure ha ọku: n'ihi na ọ bughi ndi nwere nghọta ka ọ bu; n'ihi nka Onye meworo ya agaghi-enwe obi-ebere n'aru ya, Onye kpuworo ya agaghi-emere ya amara.


Ndi ahu gāchirita onwe-ha n'ihe-ike, otù onye megide onye ọzọ, na otù onye megide ibe-ya: ha gēbulite onwe-ha, nwa-okoro megide okenye, na onye anēlilì megide onye anāsọpuru.


M'gātupia kwa ha, otù onye n'elu ibe-ya, ọbuná ndi bu nna na umu-ha n'otù; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta: M'gaghi-enwe ọmiko, M'gaghi-eme kwa ebere, M'gaghi-enwe kwa obi-ebere, ka M'we ghara ibibi ha.


Nwa-okoro na agadi-nwoke edinawo ala n'èzí nile; Umu-ab͕ọghọm nāmaghi nwoke na umu-okorọbiam adawo site na mma-agha: I b͕uwo ha n'ubọchi iwe-Gi; I b͕usiwo, I nweghi ọmiko.


Ndi-orù achiwo ayi: Ọ dighi onye nānaputa ayi n'aka-ha.


Ma Mu onwem gēmeso kwa ha n'ọnuma: anyam agaghi-enwe ebere, M'gaghi-enwe kwa ọmiko: ọ buru kwa na ha akpọ nkpu na ntim abua n'oké olu, ma M'gaghi-anu olu-ha.


Ma Mu onwem kwa, anyam agaghi-enwe ebere, M'gaghi-enwe kwa ọmiko, uzọ-ha ka M'gētiyekwasi n'isi-ha.


O we turu ime ọzọ, mua nwa-nwanyi. Jehova we si Hosea, Kpọ aha-ya Lo-ruhama: n'ihi na M'gaghi-enwe kwa obi-ebere n'aru ulo Israel ọzọ, ka M'we bupuru ha nmehie-ha ma-ọli.


Ma ub͕u a ka M'gēkpughe ọtọ-ya n'anya ndi nāhu ya n'anya, ọ dighi kwa onye ọ bula gānaputa ya n'akam.


Ndi Jekob fọduru gādi kwa n'etiti mba nile, n'etiti ọtutu ndi di iche iche, dika ọdum n'etiti anumanu nke oké ọhia, dika nwa-ọdum n'etiti ìgwè ewu na aturu nile: nke gābu, mb͕e ọ gāgabiga, ọ gāzọda, dọkasia, ọ dighi kwa onye-nnaputa di.


Gi onwe-gi gēri ihe, ma afọ agaghi-eju gi; afọ-awọrọ-gi gādigide kwa nime gi: i gēwezuga kwa ndi-gi, ma i gaghi-eme ka ha b͕apu; ma ndi i nēme ka ha b͕apu, ọ bu mma-agha ka M'gēwere ha nye.


M'gākwatu kwa oche-eze nke ala-eze nile, M'gēkpochapu kwa ike nke ala-eze nile nke mba nile; M'gākwatu kwa ub͕ọ-ala, na ndi nānọkwasi ha; inyinya na ndi nānọkwasi ha gārida kwa, onye ọ bula site na mma-agha nwa-nne-ya.


M'we b͕ujira nkpa-n'akam nke-abua, bú Ndi-ọ̀tú-udọ̀, imebi nwa-nne Juda na Israel bu.


nke ndi nāzù ha nēb͕u ha, ma ikpe adighi-ama ha; ọzọ, ndi nēre ha nāsi, Onye agọziri agọzi ka Jehova bu, n'ihi na abum ọgaranya: ndi-ọzùzù-ha adighi-enwe ọmiko n'aru ha.


M'we si, M'gaghi-azù unu: nke nānwu anwu, ya nwua; nke anēbipu ebipu, ka ebipu ya; ka ndi fọduru rie, aturu ọ bula anu-aru ibe-ya.


Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na oké ọb͕ub͕a-aghara nke Jehova gādi n'etiti ha; ha gējide kwa, onye ọ bula o jide ibe-ya aka, aka-ya gēbili kwa imegide aka madu-ibe-ya.


N'ihi na tutu ubọchi nile ahu ugwọ-ọlu madu adighi, ugwọ-ọlu anumanu adighi kwa; ọ dighi kwa udo diri onye nāpu apu ma-ọbu onye nābata abata site n'onye-nkpab͕u: eziga-kwa-ram madu nile, onye ọ bula imegide ibe-ya.


Ọ gēme kwa ka obi ndi bu nna chigharikute umu-ha, ka obi umu chigharikute kwa ndi bu nna-ha; ka M'we ghara ibia were iwezuga-ka-ebibie-ya tiḅue uwa.


Nwa-nne gārara kwa nwa-nne-ya nye n'ọnwu, nna gārara kwa nwa-ya nye: umu gēbili kwa megide ndi muru ha, me ka ha nwua anwu.


Ma eze ahu were iwe; o we ziga usu-ndi-agha-ya nile, la ndi-ob͕u-madu ahu n'iyì, rechapu kwa obodo-ha ọku.


Mb͕e ahu ka ọtutu madu gāma kwa n'ọnyà, rara kwa ibe-ha nye, kpọ kwa ibe-ha asì.


Ya mere ndi ahu tiri nkpu, si, Wepu Ya, wepu Ya, kpọgide Ya n'obe. Pailat si ha, M'gākpọgide Eze-unu n'obe? Ndi-isi-nchu-àjà zara, si, Ayi enweghi eze ma-ọbughi Sisa.


Na-eb͕ochi ayi igwa ndi mba ọzọ okwu ka ewe zọputa ha; imezu nmehie nile ha mb͕e nile: ma iwe Chineke abiakwasiwo ha rue ọgwugwu-ha.


àyi onwe-ayi gēsi aṅa b͕anari, ma ọ buru na ayi leghara oké nzọputa di otú a anya? bú nzọputa nke eburu uzọ kwu site n'ọnu Onye-nwe-ayi, ndi nuru ya we me ka o guzosie ike rue ebe ayi nọ;


N'ihi na ọ bu ikpé nke ebere nādighi ya ka agēkpe onye nēmeghi ebere: ebere nānyara ikpé isi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan