Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Zekaraya 11:2 - Bible Nso

2 Kwasie ákwá ike, gi osisi fir, n'ihi na osisi cedar adawo, n'ihi na emebiwo osisi nke mab͕uru onwe-ha: kwasienu ákwá ike, unu osisi oak nke Beshan, n'ihi na oké ọhia alùgh-alù adawo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Kwasie akwa ike, gị osisi junipa, nʼihi na osisi sida adaala, nʼihi na e mebiela osisi ukwu ndị niile ahụ mabigara mma oke. Kwasienụ akwa ike, unu osisi ook nke Bashan, nʼihi na e gbudachala oke ọhịa ahụ!

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Zekaraya 11:2
12 Iomraidhean Croise  

Nwa nke madu, che iru-gi n'uzọ Ndida, me ka okwu-gi busa dika miri-ozuzo n'ebe Ndida di, bue amuma megide oké ọhia nke ọhia ahu di na Negeb;


Osisi oak nke si na Beshan aputa ka ha jiworo me umara-gi nile; oche-umara-gi ka ha jiworo ọdu, ekwukọyere n'osisi igbe nke si n'agwe-etiti Kitim aputa, me.


Ha onwe-ha so-kwa-ra ya ridarue ala-mọ, jekuru ndi ejiri mma-agha b͕u; e, ndi bu ogwe-aka-ya, ndi biri na ǹdò-ya n'etiti mba nile.


Ahuhu diri ndi nọ jū na Zaion, na ndi nwere ntukwasi-obi n'ugwu Sameria, ndi akpọrọ n'aha n'aha n'etiti isi mba nke mba nile, ndi ulo Israel biakuteworo!


Meghe uzọ-gi nile, gi Lebanon, ka ọku we ripia osisi cedar gi nile.


Ge nti, ọ bu olu nke ikwasi-ákwá-ike nke ndi-ọzùzù-aturu! n'ihi na emebiwo ebube-ha: ge nti, ọ bu olu ib͕ọ-uja nke umu-ọdum! n'ihi na emebiwo nbili-elu nke Jọdan.


N'ihi na asi na ha nēme ihe ndia mb͕e osisi di ndu, gini ka agēme mb͕e ọ kpọrọ nku?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan