Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Zekaraya 10:8 - Bible Nso

8 M'gākpọkọta kwa ha òkù, chikọta ha; n'ihi na ab͕aputawom ha: ha gāba kwa uba otú ha baworo uba.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Mgbe ahụ, aga m akpọ ha oku, chịkọtaa ha. Nʼezie, aga m agbapụta ha, ha ga-adịkwa ukwuu dịka ha dị na mbụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Zekaraya 10:8
25 Iomraidhean Croise  

Juda na Israel di ọtutu, dika ájá nke di n'akuku oké osimiri n'iba-uba, nēri ihe, nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, nāṅuri kwa ọṅu.


Ma umu Israel muru ọmùmù, ri nne, ba uba, we nwe ume nke uku; ala ahu we juputa na ha.


Ehichapuwom njehie-gi nile, dika oké igwe-oji, hichapu kwa nmehie-gi nile, dika igwe-oji: Iaghachikutem; n'ihi na ab͕aputawom i.


Sinu na Babilon pua, b͕anarinu ndi Kaldea; werenu olu nke iti-nkpu-ọṅù gosi, me ka anuru nka, menu ka ọ puta ìhè rue nsọtu uwa: sinu, Jehova ab͕aputawo orù-Ya, bú Jekob.


O we weliere mba ndi sitere n'ebe di anya ọkọlọtọ, kpọkọta ya òkù site na nsọtu uwa: ma, le, ọ nēme ngwa bia ọsọsọ:


Ndi Jehova ab͕aputara ab͕aputa gālata kwa, were iti-nkpu-ọṅù bata nime Zaion; ọṅù ebighi-ebi gādi kwa n'isi-ha: obi-utọ na ọṅù ka ha gābiarute, iru-újú na ize-ume ab͕alawo.


O gēru kwa, n'ubọchi ahu, na Jehova gākpọkọta ijiji nke di na nsọtu osimiri Nail nile nke Ijipt òkù, kpọ kwa aṅu nke di n'ala Asiria.


Ha gābia kwa, ha nile gēbekwasi kwa na ndagwurugwu nile nke ebe di nkputankpu, na nime nb͕awa nile nke nkume nile di elu, na n'ogwu nile, na n'ọzara nile.


Otú agaghi-agu usu ihe di n'elu-igwe ọnu, na otú agaghi-atùta ájá nke oké osimiri; otú a ka M'gēme ka nkpuru Devid, bú orùm, na ndi Livai ndi nējerem ozi, ba uba.


Ma ọnu-ọgugu umu Israel gādi ka ájá oké osimiri, nke anāgagh ātùta, nke anāgaghi-agu kwa ọnu; ọ gēru kwa na, n'ebe ahu nke anāsi ha, Ọ bughi ndim ka unu bu, n'ebe ahu ka agāsi ha, Umu Chineke di ndu ka unu bu.


Gi Jekob, aghaghm ime ka ndi-gi nile zukọta; aghaghm ichikọta ndi Israel fọduru; n'otù ka M'gēdokọ ha dika ìgwè ewu na aturu nke Bọzra: dika ìgwè aturu n'etiti ebe-ita-nri-ya; ha gēme oké nkpọtu n'ihi uba madu.


Gi onwe-gi kwa, n'ihi ọbara ọb͕ub͕a-ndu-gi ka M'zipuworo ndi-nkpọrọ-gi n'olùlù nke miri nādighi nime ya.


Biakutenum, unu nile ndi nādọb͕u onwe-unu n'ọlu, ndi ebowo-kwa-ra ibu di arọ́, Mu onwem gēme kwa ka unu zuru ike.


Mọ Nsọ na nwanyi ahu anālu ọhu nāsi kwa, Bia. Onye nānu, ya si kwa, Bia. Onye akpiri nākpọ kwa nku, ya bia: onye nāchọ, ya nara miri nke ndu ahu n'efù.


Mb͕e ihe ndia gasiri m'we hu, ma le, oké ìgwè madu, nke onye ọ bula nāpughi iguta ọnu, ndi si na mba nile ọ bula, na ebo nile, na ndi nile, na asusu nile, puta, nēguzo n'iru oche-eze ahu na n'iru Nwa-aturu ahu, eb͕okwasiworo ha uwe-nwuda di ọcha, igu-nkwu di kwa n'aka-ha;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan