Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Zekaraya 10:12 - Bible Nso

12 M'gēme kwa ka ha di ike nime Jehova; ọ bu kwa n'aha-Ya ka ha ganējeghari; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Aga m eme ka ha dị ike nʼime Onyenwe anyị, ọ bụkwa nʼaha ya ka ha ga na-ejegharị nʼudo.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Zekaraya 10:12
18 Iomraidhean Croise  

Ọ sim, Jehova, Onye m'jeghariworo n'iru Ya, gēziga mọ-ozi-Ya ka gi na ya yikọ je, Ọ gēme kwa ka ije-gi ga nke-ọma; i gāluta-kwa-ra nwam nwunye sitere n'ab͕urum, na n'ulo nnam:


Inok na Chineke we yikọ nējeghari: ọ nọghi kwa: n'ihi na Chineke kuru ya la.


Ulo Jekob, bianu, ka ayi jegharia n'ìhè Jehova.


atula egwu, gi ka M'nọyere: elela anya buruburu n'ujọ, n'ihi na Mu onwem bu Chineke-gi: M'gāb͕a gi ume; e, M'gēyere gi aka; e, M'gēji aka-nri nke ezi omumem kwagide gi.


Nání na Jehova ka ezi omume nile na ike di, (mu ka agwara okwu a): Ya ka madu gābiakute, ihere gēme kwa ndi ahu nile iwe-ha di ọku megide Ya.


M'gēme kwa ka ogwe-aka abua nke eze Babilon sie ike, M'gētiye kwa mma-agham n'aka-ya: ma M'gāb͕aji ogwe-aka abua nke Fero, ọ gāsu kwa ude nke onye emeruru aru nke-uku n'iru ya.


N'ihi na ndi nile di iche iche nējeghari, onye ọ bula n'aha nke chi-ya; ayi onwe-ayi ganējeghari kwa n'aha Jehova, bú Chineke-ayi, rue mb͕e nile ebighi-ebi.


M'gēme kwa ka ulo Juda di ike, M'gāzọputa kwa ulo Josef, me ka ha lata, n'ihi na enwerem obi-ebere n'aru ha: ha gādi kwa ka agāsi na achupughm ha-ri: n'ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-ha, M'gāza kwa ha.


Ndi-isi nke usu nile nke nnù madu abua na ọgu iri nke Juda gāsi kwa n'obi-ha, Ume m'nwere ka ndi bi na Jerusalem gābu nime Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke-ha.


Nke fọduru, menu onwe-unu ka unu di ike nime Onye-nwe-ayi, ya na nime idi-ike nke ike-Ya.


Enwerem ike n'ihe nile nime Onye ahu Nke nēmem ka m'di ike.


Ya mere dika unu nara Kraist-ayi, bú Jisus Onye-nwe-ayi, nējegharinu nime Ya,


Ihe nile ọ bula unu nēme kwa, n'okwu ma-ọbu n'ọlu, nēmenu ha nile n'aha Onye-nwe-ayi Jisus, nēkele Chineke, bú Nna-ayi, site n'aka-Ya.


ka unu we nējeghari dika ọ kwesiri Chineke, Onye nākpọbata unu n'ala-eze na ebube nke aka Ya.


Ya mere nke fọduru, umu-nna-ayi, ayi nēkpere unu, nāriọ kwa unu nime Onye-nwe-ayi Jisus, ka, dika unu natara n'aka-ayi otú unu nāghaghi ijeghari na ime ihe gātọ Chineke utọ, ọbuná dika unu nējeghari, ka unu nābabiga ókè nke-uku kari.


Ya mere, gi onwe-gi, nwam, ka eme ka i di ike n'amara nke di nime Kraist Jisus.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan