Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Zekaraya 10:11 - Bible Nso

11 Ọ gāgabiga kwa n'oké osimiri nke nkpab͕u, tie oké osimiri nke ọtutu nmali-miri, ebe di omimi nile nke Nail gātakọrọ kwa: agēbuda kwa npako Asiria n'ala, nkpa-n'aka Ijipt gēwezuga kwa onwe-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Ha ga-esi nʼosimiri nsogbu gafee. A ga-emekwa ka mmali elu nke osimiri dajụọ. Ebe obibi niile nke osimiri Naịl ga-atakọrọkwa. A ga-egbuda mpako niile nke Asịrịa, wezugakwa mkpara ọchịchị nke ndị Ijipt.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Zekaraya 10:11
25 Iomraidhean Croise  

Ma Chineke chetara Noa, na anu nile di ndu, na anu-ulo nile nke ya na ha nọ n'ub͕ọ; Chineke we me ka ifufe gabiga n'elu uwa, miri we taba;


O we chiri uwe-nwuda Elaija, nke danariri ya, o we tie miri, si, Òle ebe Jehova nọ, bú Chineke Elaija? Ya onwe-ya kwa, o we tie miri, ewe kera ya otù uzọ ga n'otù akuku, otù uzọ ga n'akuku ọzọ; Elaisha we gabiga.


Elaija we chiri uwe - nwuda - ya, piakọta ya, tie miri ahu, ewe kera ya, otù uzọ ga n'otù akuku, otù uzọ ga n'akuku ọzọ, ha abua we gabiga n'ala-akọrọ.


ha we were ọṅù me ememe achicha ekoghi-eko ubọchi asa: n'ihi na Jehova mere ka ha ṅuria ọṅu, O me-kwa-ra ka obi eze Asiria chigharia n'ebe ha nọ, ime ka aka-ha di ike n'ije-ozi nke ulo Chineke, bú Chineke Israel.


Oké osimiri huru ya, we b͕alaga; Jọdan chighariri la azu.


Gini nēme gi, oké osimiri, na i nāb͕a ọsọ? Gini nēme gi, Jọdan, na i nēchighari la azu?


na M'gētipia Asiria n'alam, ọ bu kwa n'elu ugwum nile ka M'gāzọ ya ukwu: yoke-ya gēsi kwa n'olu-ha wezuga onwe-ya, ibu-ya gēsi n'elu ubu-ha wezuga onwe-ya.


N'ubọchi ahu Ijipt gādi ka ndinyom: ọ gāma kwa jijiji tu kwa egwu n'ihi nfeghari aka nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nke Ya onwe-ya nēfeghari n'elu ya.


Mb͕e i nāgabiga nime miri, gi ka M'gānọyere; mb͕e i nāgabiga nime osimiri, ha agaghi-erùchapu gi: mb͕e i nēje ije n'ọku, ọku agaghi-aru gi; ire-ọku agaghi-ere kwa gi ọku.


Onye ahu Nke nāsi ob͕u-miri, Takọ; osimiri-gi nile ka M'gēme kwa ka ha tachasia:


Ọ̀ bughi gi onwe-gi bu ihe ahu nke meworo ka oké osimiri tasia, bú miri nke ob͕u-miri riri nne; nke meworo ebe nile miri emi nke oké osimiri ka ọ ghọ uzọ ndi emeworo ka ha nwere onwe-ha gēsi gabiga?


Teta, teta, yiri ike dika uwe, gi ogwe-aka Jehova; teta, dika n'ubọchi nile nke mb͕e ochie, bú ọb͕ọ nile nke mb͕e nile ebighi-ebi gara aga. Ọ̀ bughi gi onwe-gi bu ihe ahu nke kpọwasiworo Rehab, nke mapúworo ogologo anu-miri?


Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: M'gēme kwa ka arusi nile la n'iyì, M'gēme kwa ihe-efu nile kwusi na Nof; ọ dighi kwa onye-isi gēsi n'ala Ijipt puta ọzọ: M'gētiye kwa egwu n'ala Ijipt.


Ọ gēseti kwa aka-Ya imegide Ugwu, me ka Asiria la n'iyì; Ọ gēme kwa ka Nineve ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ala kpọrọ nku dika ọzara.


Mọ-ozi nke-isi we wusi ọkwa-ya n'elu osimiri uku ahu, bú Yufretis; miri-ya we tasia, ka ewe dozie uzọ ndi-eze ahu ndi si n'ọwūwa-anyanwu bia.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan