Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Zekaraya 1:5 - Bible Nso

5 Nna-unu-hà, òle ebe ha nọ? ndi-amuma kwa, ọ̀ bu rue mb͕e ebighi-ebi ka ha nādi ndu?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Olee ebe ka nna nna unu ha nọ ugbu a? Ndị amụma ahụ, ha na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Zekaraya 1:5
16 Iomraidhean Croise  

Ma Elaisha nāria ọria nke ọria-ya ahu nke ọ nwuru nime ya: Joash, bú eze Israel, we ridakuru ya, kwa ákwá n'iru ya, si, Nnam, nnam, ub͕ọ-ala Israel, na ndi-inyinya-ya!


Elaisha we nwua, ha we lìe ya. Ma usu ndi nāpunara madu ihe nke ndi Moab batara n'ala mb͕e arọ ọhu biara.


Ubọchi arọ nile ayi di ọgu arọ atọ na iri; Ma ọ buru na ha esite n'idi-ike-ayi rue ọgu arọ anọ, Otú ọ di, nganga-ha bu nání idọb͕u-onwe-ha-n'ọlu na ajọ ihe; N'ihi na ọ b͕apuwo ọsọsọ, ayi we fela dika nnunu.


Otù ọgbọ alá, ọb͕ọ ọzọ abia; ma uwa nēguzoru mb͕e ebighi-ebi.


ọzọ, ha gātu egwu ihe di elu, ihe-ujọ di iche iche gādi kwa n'uzọ; osisi almond gāb͕ọwa kwa okoko-ya, ukpala gāghọ kwa ibu, ọchichọ gāgwu kwa: n'ihi na madu nāla n'ulo ebighi-ebi ya, ndi nēti aka n'obi ewe jegharia n'amá buruburu:


ájá ewe laghachi n'ala dika o si diri, mọ alaghachikuru kwa Chineke Onye nyere ya.


Were kwa n'onwe-gi akwukwọ-npiakọta ọzọ, dekwasi na ya okwu mbu nile nke di n'elu akwukwọ-npiakọta mbu, nke Jehoiakim, bú eze Juda, sureworo ọku.


Nna-ayi-hà emehiewo, ha adighi kwa ndu; Ayi onwe-ayi eburuwo ajọ omume nile ha.


Ndi-Ju siri Ya, Ub͕u a ka ayi mara na I nwere mọ ọjọ. Abraham nwuru, na ndi-amuma; ma Gi onwe-gi nāsi, Ọ buru na onye ọ bula edebe okwum, ọ gaghi-edetu ọnwu ire ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi.


N'ihi na Devid, mb͕e o jesiri ọb͕ọ-ya ozi, o sitere n'ìzù Chineke da n'ura ọnwu, ewe tọb͕ọ ya n'ebe nna-ya-hà nọ, o we hu ire-uré:


Dika ọ bu kwa ihe edebeworo madu ka ha nwua anwu nání otù mb͕e, ma mb͕e nka gasiri ikpé eso ya;


Samuel we nwua; Israel nile we chikọta onwe-ha, tiere ya aka n'obi, lìe ya n'ulo-ya na Rema. Devid we bilie, rida rue ọzara Peran.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan