Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Zekaraya 1:3 - Bible Nso

3 I gāsi kwa ha, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Laghachikutenum, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), M'gālaghachikute kwa unu, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Nʼihi ya, gwa ha, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na-ekwu. ‘Lọghachikwutenụ m,’ otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara, ‘Mụ onwe m kwa ga-alọghachikwute unu.’ Ọ bụ ihe Onyenwe anyị Onye pụrụ ime ihe niile, na-ekwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Zekaraya 1:3
33 Iomraidhean Croise  

o we pua izute Esa, si ya, Nurunum, Esa na Juda na Benjamin nile: Jehova nọyere unu, mb͕e unu nọyere Ya; ọ buru kwa na unu achọ Ya, Ọ gēme ka unu chọta Ya; ma ọ buru na unu arapu Ya, Ọ gārapu unu.


ha we chigharikute Jehova, bú Chineke Israel, nime nkpab͕u diri ha, we chọ Ya, O we me ka ha chọta Ya.


Ma mb͕e izu-ike diri ha, ha me-kwa-ra ihe ọjọ n'iru Gi ọzọ: I we rapu ha n'aka ndi-iro-ha, ha we nwe ike n'aru ha: ha we laghachi, tikue Gi, Gi onwe-gi we site n'elu-igwe nu, naputa ha ọtutu ub͕ò dika obi-ebere-Gi si di,


Ọ buru na i laghachikute Onye puru ime ihe nile, agēwuli gi elu dika ulo; I gēme ka ajọ omume di anya n'ebe ulo-ikwū-gi nile di.


Laghachikutenu Onye ahu Nke umu Israel siri n'aka-Ya wezuga onwe-ha nke-uku.


Ehichapuwom njehie-gi nile, dika oké igwe-oji, hichapu kwa nmehie-gi nile, dika igwe-oji: Iaghachikutem; n'ihi na ab͕aputawom i.


O gēru kwa, mb͕e M'ropusiri ha, na M'gēnwe kwa obi-ebere n'aru ha ọzọ; M'gēme kwa ka ha lata, onye ọ bula n'ihe-nketa-ya, na onye ọ bula n'ala-ya.


nāsi, Biko, latanu, onye ọ bula ya si n'uzọ ọjọ ya na n'ihe ọjọ nke omume nile unu lata, biri-kwa-nu n'elu ala nke Jehova nyere unu, nye kwa nna-unu-hà, site na mb͕e ebighi-ebi gara aga we rue mb͕e ebighi-ebi di n'iru:


Ọ si, Le, ọ buru na nwoke achupu nwunye-ya, nwayi ahu ewe si n'ebe ọ nọ la, we ghọ nwunye nke nwoke ọzọ, di mbu ya, ọ̀ gālu kwa ya ọzọ? àgaghi-emeru ala ahu emeru nke-uku? Ma gi onwe-gi akwawo iko, gi na ọtutu ndi-iko: ì si na i gālaghachikutem? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Latanu, umu nke nādaghachi azu, M'gāgwọ ndaghachi-azu nile nke unu. Le ayi anya, ayi abiakutewo Gi; n'ihi na Gi onwe-gi bu Jehova, bú Chineke-ayi.


M'we zitere unu ndi-orùm nile, bú ndi-amuma, nēbili n'isi-ututu nēzite ha, si, Biko, sinu, onye ọ bula n'uzọ ọjọ ya, lata, me-kwa-nu ka omume nile unu di nma, unu ejeso-kwa-la chi ọzọ ifè ha, biri-kwa-nu n'ala nka nke M'nyere unu, nye kwa nna-unu-hà: ma unu atọghi nti-unu n'ala, unu egeghkwam nti.


Ọ buru na i gālata, gi Israel, (ọ bu ihe si nọnu Jehova puta), Mu ka i gālaghachikute: ọ buru kwa na i gēwezuga ihe-árú-gi nile n'irum, i gaghi-awaghari;


Ma unu asiwo, Gini mere nwa nējighi ebu ufọdu n'ajọ omume nna-ya? Mb͕e nwa ahu meworo ihe ekpere n'ikpe na ezi omume, debe ukpurum nile, me ha, ọ ghaghi idi ndu.


Tupunu n'aru unu njehie nile unu nke unu jehieworo nime ha; mere onwe-unu obi ọhu na mọ ọhu: ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka unu gānwu, ulo Israel?


N'ihi na ọnwu nke onye nānwu anwu adighi-atọm utọ, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta): ya bu chigharianu, we di ndu.


Si ha, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), ọnwu nke onye nēmebi iwu adighi-atọm utọ ma-ọli; kama ọ nātọm utọ mb͕e onye nēmebi iwu si n'uzọ-ya chigharia, we di ndu: chigharianu, sinu n'uzọ ọjọ nile unu chigharia; ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka unu gānwu, ulo Israel?


Israel, laghachikute Jehova, bú Chineke-gi; n'ihi na i suwo ngọngọ site n'ajọ omume-gi.


M'gāgwọ ndaghachi-azu-ha, M'gāhu ha n'anya n'afọ-ofufo: n'ihi na iwem esiwo n'aru ya chigharia.


Bianu, ka ayi laghachikute Jehova: n'ihi na Ya onwe-ya adọkawo, Ọ gāgwọ kwa ayi; O tib͕uwo, Ọ gēkechi kwa ayi.


Ma ọbuná ub͕u a, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), werenu obi-unu nile, werekwa obubu-ọnu, were kwa ikwa-ákwá, were kwa iti-aka-n'obi, chigharikutem:


Site n'ubọchi nile nke nna-unu-hà ka unu wezugaworo onwe-unu n'ukpurum nile, unu edebeghi kwa ha. Laghachikutenum, Mu onwem gālaghachikute kwa unu, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri. Ma unu nāsi, Nìme gini ka ayi gālaghachi?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan