I we nye ha n'aka ndi nākpab͕u ha, ha we kpab͕ue ha: ma na mb͕e nkpab͕u-ha, ha we tikue Gi, Gi onwe-gi we site n'elu-igwe nu, nye ha ndi-nzọputa dika ọtutu obi-ebere-Gi nile si di, ha we zọputa ha n'aka ndi nākpab͕u ha.
Uzú nākpu ihe-ọlu, o were icheku alu, were kwa otùtù-ya nile akpu ya, were kwa ogwe-aka-ya di ike alu ya: ọzọ, agu nāgu ya, ike we ghara idi; ọ ṅughi miri, o we da #mbà.
O we je ije n'ọzara, ga ala Edom na ala Moab buruburu, biarue akuku ọwuwa-anyanwu ala Moab, ha we ma ulo-ikwū-ha n'ofè Anon; ma ha abaghi n'ókè-ala Moab, n'ihi na Anon bu ókè-ala Moab.