Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Zekaraya 1:16 - Bible Nso

16 N'ihi nka ka Jehova siri otú a: Ejiwom obi-ebere nile laghachikute Jerusalem; agēwu ulom nime ya, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), agēseti kwa eriri-ọtùtù n'elu Jerusalem.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 “Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Aga m eji obi ebere lọghachi na Jerusalem. Nʼebe ahụ kwa ka a ga-ewugharị ụlọnsọ ukwuu m. A ga-esetikwa eriri e ji atụ ihe nʼelu Jerusalem.’ Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Zekaraya 1:16
24 Iomraidhean Croise  

Ònye doro ọtùtù-ya nile, ma asi na i mara? Ma-ọbu ònye setiri eriri-ọtùtù n'elu ya?


I gāsi kwa n'ubọchi ahu, M'gēkele Gi, Jehova; N'ihi na ọ bu ezie na I wesaram iwe, ma iwe-Gi alaghachiwo azu, I we kasiem obi.


Ma okwolo na ebinta gēnweta ya; okwukwu na ugolo-ọma gēbi nime ya: Ọ gēseti kwa eriri nke itọb͕ọrọ-n'efu na nkume-ọtùtù nke itọb͕ọrọ-nkiti n'elu ya.


Otú a ka Jehova siri: Le, M'gaje ime ka ulo-ikwū nile nke Jekob adọtara n'agha lata, ọ bu kwa n'aru ebe-obidi-ya nile ka M'gēnwe obi-ebere; agēwu kwa obodo n'elu obo-ya, agēbi kwa n'ulo-elu-ya dika esiri ebi ya.


O we me ka m'bia n'ebe ahu, ma le, otù nwoke, ma ele ya anya ọ di ka ọla si di n'ile ya anya, eriri flax di kwa n'aka-ya, ya na amì eji atù ihe; onye ahu nēguzo kwa n'ọnu-uzọ-ama.


Mb͕e nwoke ahu puru ga n'Iru-anyanwu jide eriri n'aka-ya, o we tùa nnù cubit abua na ọgu iri, me ka m'gabiga miri ahu, ọ bu miri nke ruru nkwonkwo-ukwu.


Buruburu-ya gādi orú nnù ami uzọ abua na nnù ise: ma aha obodo ahu site n'ubọ̀chi ahu gābu, Jehova nọ n'ebe ahu.


Jehova we kpọte mọ Zerubabel nwa Shealtiel, bú onye nāchi ala Juda, na mọ Joshua nwa Jehozadak, bú onye-isi-nchu-àjà, na mọ nke ndi Israel nile fọduru; ha we bia je ozi n'ulo Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke-ha,


M'gēme kwa ka ulo Juda di ike, M'gāzọputa kwa ulo Josef, me ka ha lata, n'ihi na enwerem obi-ebere n'aru ha: ha gādi kwa ka agāsi na achupughm ha-ri: n'ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-ha, M'gāza kwa ha.


si ya, B͕a ọsọ, gwa nwa-okorọbia nka okwu, si, N'obodo di iche iche nēnweghi mb͕idi ka Jerusalem gēbi, site n'iba-uba madu na anumanu di nime ya.


N'ihi na Mu onwem gāburu ya mb͕idi ọku buruburu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ọ bu kwa ebube ka M'gāghọ n'etiti ya.


Éwù, éwù, sinu n'ala Ugwu b͕alaga, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): n'ihi na dika ifufe anọ nke elu-igwe ka M'chusaworo unu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Aka abua nke Zerubabel atọwo ntọ-ala nke ulo a, aka-ya abua gēwubì kwa ya; i we mara na Jehova nke usu nile nke ndi-agha ezìwom biakute unu.


Otú a ka Jehova siri: Alaghachiwom na Zaion, M'gēbi kwa n'etiti Jerusalem: agākpọ kwa Jerusalem Obodo ezi-okwu; agākpọ kwa ugwu nke Jehova nke usu nile ndi-agha Ugwu nsọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan