Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Zefanaya 3:9 - Bible Nso

9 N'ihi na mb͕e ahu ka M'gāb͕anwere ndi nile di iche iche eb͕ub͕ere-ọnu di ọcha, ka ha nile we kpọkue aha Jehova, ifè Ya n'otù ùbú.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 “Mgbe ahụ, aga m anụcha egbugbere ọnụ ndị niile dị iche iche mee ka ọ bụrụ ihe dị ọcha, ka ha niile nwee ike ịkpọku aha Onyenwe anyị, ma jikọta aka fekwaa ya ofufe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Zefanaya 3:9
21 Iomraidhean Croise  

Uwa nile we nwe otù asusu na otù uzọ okwu.


Set kwa, ya onwe-ya ka amu-kwa-ra nwa-nwoke nye; ọ kpọ aha-ya Enosh: mb͕e ahu ka amalitere ikpọku aha Jehova.


Site n'ọwuwa anyanwu rue ọdida-ya Aha Jehova gābu ihe anēto eto.


Nsọtu nile nke uwa gēcheta, laghachikute kwa Jehova: Ab͕uru nile nke mba nile gākpọ kwa isi ala n'iru Gi.


N'ubọchi ahu obodo ise gādi n'ala Ijipt ndi nāsu asusu Kenean, ndi nāṅuru Jehova nke usu nile nke ndi-agha iyi; Obodo nkwada ka agākpọ otù nime ha.


Anamekè nkpuru eb͕ub͕ere-ọnu abua: Udo, udo, diri onye nọ n'ebe di anya, di-kwa-ra onye nọ nso, ka Jehova siri; M'gēme kwa ka aru di ya ike.


o we were ya metu ọnum, si, Le, nka emetuwo eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua; ewe wezuga ajọ omume-gi, kpuchi kwa nmehie-gi.


Jehova, ikem, na ebem siri ike, na ebe-nb͕abàm n'ubọchi nkapab͕u, Gi ka mba nile gābiakute site na nsọtu nile nke uwa, si, Nání okwu-agha ka nna-ayi-hà ketaworo, bú ihe-efu na ihe nke ọ nadighi urù ha bara.


gi jikọta kwa ha, otù na ibe-ya, nye onwe-gi, ka ha ghọ otù osisi, ka ha we ghọ otù n'aka-gi.


N'ihi na uwa gējuputa n'ọmuma ebube Jehova, dika miri si ekpuchi oké osimiri.


Onye di egwu ka Jehova gābu n'imegide ha: n'ihi na Ọ gēme ka chi nile nke uwa ta aru; madu gākpọ kwa isi ala nye Ya, onye ọ bula site n'ọnọdu-ya, bú agwe-etiti nile nke mba nile.


Jehova gāghọ kwa eze elu-uwa nile: n'ubọchi ahu ka Jehova gādi otù, aha-Ya gādi kwa otù.


Ọtutu mba gārapa-kwa-ra na Jehova n'ubọchi ahu, ghọ-kwa-ram otù ndi: M'gēbi kwa n'etiti gi, i we mara na Jehova nke usu nile nke ndi-agha ezìwom biakute gi.


Ezi madu nēsi n'ezi àkù-ya atuputa ezi ihe: ajọ madu nēsi kwa n'ajọ àkù-ya atuputa ajọ ihe.


Ka okwu ọ bula nke ruru aru ghara isi n'ọnu-unu puta, kama ihe bu ezi ihe, iwuli madu elu dika ulo, dika nkpà si di, ka o we nye ndi nānu ya amara.


Mọ-ozi nke-asa we fùa opì; oké olu we da n'elu-igwe, ha we si, Ala-eze nke uwa aghọwo ala-eze nke Onye-nwe-ayi, na nke Kraist-Ya: Ọ gābu kwa eze rue mb͕e nile ebighi-ebi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan