Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Zefanaya 3:6 - Bible Nso

6 Ebipuwom mba di iche iche, ulo-nkuku nile ha tọb͕ọrọ n'efu; emewom ka èzí nile ha buru nkpọnkpọ-ebe, onye-ngabiga we ghara idi: emebisiwo obodo nile ha, onye ọ bula we ghara idi, ha we ghara inwe onye-obibi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 “Egbuchapụla m mba niile dị iche iche, kwatukwaa ebe ha niile e wusiri ike. Ahapụla m okporoụzọ ha ka ọ bụrụ ihe a gbahapụrụ agbahapụ, ọ dịkwaghị onye na-esi na ha agabiga. A laala obodo ha niile nʼiyi, ọ dịkwaghị onye fọdụrụ, ọ bụladị otu onye.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Zefanaya 3:6
19 Iomraidhean Croise  

Nka bu nzube ahu nke anēzube n'elu uwa nile: nka bu kwa aka ahu nke anēseti n'aru mba nile.


Mọ-ozi nke Jehova we pua, tib͕ue n'ọmuma-ulo-ikwū Asiria orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ atọ, na nnù ndikom abua na ọgu iri: madu we bilie n'isi-ututu, ma, le, ha nile bu ozu nwuru anwu.


M'we si, Rùe ole mb͕e, Onye-nwe-ayi? O we si, Rue mb͕e obodo nile tọb͕ọrọ n'efu nēnweghi onye-obibi, ulo nile kwa, nēnweghi madu; rue mb͕e emeworo ka ala ndi ahu tọb͕ọrọ n'efu, ọbuná ebe tọb͕ọrọ n'efu,


Ònye bu onye mara ihe, ka o we ghọta nka ònye bu kwa onye ahu ọnu Jehova gwaworo okwu, ka o we gosi ya? n'ìhi gini ka ala nka laworo n'iyì, esure kwa ya ọku dika ọzara, onye-ngabiga we ghara idi?


M'gēme obodo nile unu nkpọnkpọ ebe, me kwa ebe nsọ unu ka ha tọb͕ọrọ n'efu, M'gaghi-anu kwa ísì utọ unu.


Ahuhu diri ndi bi n'akuku oké osimiri, bú mba ndi Keret! Okwu Jehova nēmegide unu, Kenean, ala ndi Filistia; M'gēme kwa ka i la n'iyì ghara inwe onye-obibi.


ma M'gēfesa ha dika oké ifufe n'etiti mba nile ndi ha nāmaghi. Ala nka we tọb͕ọrọ n'efu n'azu ha, ghara inwe onye-ngabiga ma-ọbu onye nālata: n'ihi na ha mere ala anāchọsi ike ka ọ ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu.


Le, anārapuru unu ulo-unu ka ọ tọb͕ọrọ n'efu.


Ma ihe ndia nēmeri ndi ahu n'uzọ ihe-atù; ewe de ha n'akwukwọ nsọ ka ha we buru ihe idu ayi ọdú, ndi ọgwugwu oge ndia ruteworo.


Ma ihe ndia ghọrọ ihe-atù nye ayi, ka ayi we ghara ibu ndi agu ihe ọjọ nāgu, dika agu ihe ọjọ gu-kwa-ra ndi ahu.


Lenu, emewom ka mba ndia nke fọduru dayere unu n'ihe-nketa diri ebo nile unu, site na Jọdan, ha na mba ahu nile ndi m'bipuworo, we rue oké osimiri uku ahu n'ọdida anyanwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan