Zefanaya 3:20 - Bible Nso20 Na mb͕e ahu ka M'gēme ka unu bata, ọ bu kwa na mb͕e ahu ka M'gāchikọta unu: n'ihi na M'gēme ka unu ghọ aha, ghọ kwa otuto n'etiti ndi nile di iche iche nke uwa, mb͕e M'gēme ka ndi-unu adọtara n'agha lata n'anya-unu, ka Jehova siri. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a20 Nʼoge ahụ, aga m akpọlata unu nʼụlọ; mgbe m ga-akpọkọta unu ọnụ. Aga m eme ka unu na-ewu ewu ka unu nwekwaa otuto nʼetiti mmadụ niile bi nʼụwa, mgbe m ga-eweghachi ihe ọma unu nʼihu anya unu.” Ka Onyenwe anyị kwuru. Faic an caibideil |