Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Zefanaya 2:8 - Bible Nso

8 Anuwom ita-uta Moab, na nkwulu nile nke umu Amon, nke ha jiworo ta ndim uta, me onwe-ha uku megide ókè-ala-ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 “Anụla m okwu ọjọọ niile, nke ndị Moab, na ịkwa emo niile nke ndị Amọn, nụkwa ịbasị mba ike ha megide ndị nke m na-anya isi na ha ga-ewere ala ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Zefanaya 2:8
19 Iomraidhean Croise  

Ada we mua nwa-nwoke, kpọ aha-ya Moab: onye ahu bu nna ndi Moab rue ta.


Nke-ntà kwa, ya onwe-ya mu-kwa-ra nwa-nwoke, kpọ aha-ya Ben-ami: onye ahu bu nna umu Amon rue ta.


Ibu ebero Moab. N'ihi na n'otù abali ka ebibiworo Ai nke Moab, me ka ọ la n'iyì; n'ihi na n'otù abali ka ebibiworo Kia nke Moab, me ka ọ la n'iyì.


Ayi anuwo ihe bayere npako Moab, na ọ nāpako npako nke-uku; ọbuná ihe bayere nganga-ya, na npako-ya, na nrubiga-ókè-iwe-ya; ihe nēzighi ezi ka ekwukwu-ya nile bu.


Otú a ka Jehova kwuru megide ndi-ab͕ata-obi ọjọm nile, ndi nēmetu ihe-nketa ahu aka nke M'meworo ka ndim, bú Israel, keta: le, M'gaje iropu ha n'elu ala-ha, ulo Juda ka M'gēropu kwa n'etiti ha.


Nke diri Moab. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Ahuhu diri Nebo! n'ihi na emebiwo ya; emewo ka ihere me Kiriataim, ewerewo ya: emewo ka ihere me Misgab, ọ nātu kwa ujọ.


Nke diri umu Amon. Otú a ka Jehova siri: Ọ̀ dighi umu-ndikom Israel nwere? ọ̀ dighi onye-nnweta ihe-ya o nwere? Gini mere Malkam ji nweta Gad, ndi-ya we biri n'obodo-ya nile?


I nuwo ita-uta-ha, Jehova, na èchìchè nile ha megidem;


Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, bue amuma, si, Okwu di otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova kwuru bayere umu Amon, baye-kwa-ra ita-uta-ha, si; gi si kwa, Le, mma-agha, bú mma-agha nke amiputaworo, n'ihi ob͕ub͕u ka emere ya ka ọ nēb͕u maramara, otú ọ gēkwe ya inagide, ka o we di ka àmùmà:


Okwu Jehova we ruem nti, si,


I gāma kwa na Mu onwem, bú Jehova, anuwo okwu-nlelì-gi nile nke i kwuworo megide ugwu nile nke Israel, si, Ha bu ebe tọb͕ọrọ n'efu, ayi ka ewereworo ha nye ka ayi we ripia ha.


Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na onye-iro asiwo megide unu, Ehe! na, Ebe di elu nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga aghọworo ayi ihe-nnweta:


Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke umu Amon, e, n'ihi anọ, ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi; n'ihi na ha ab͕awawo ndinyom Gilead di ime afọ ka ha we me ka ókè-ala-ha sa mbara:


Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke Moab, e, n'ihi anọ, ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n'ihi na o surere ọkpukpu eze Edom me ka ha ghọ nzu:


Nka ka ha gēnwe n'ihi npako-ha, n'ihi na ha atawo ndi Jehova nke usu nile nke ndi-agha uta, me onwe-ha uku imegide ha.


Jehova we si Joshua, Ta ka M'kpochapuworo ihe-ita-uta nke Ijipt n'aru unu. Ewe kpọ aha ebe ahu Gilgal, rue ta.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan