Zefanaya 2:7 - Bible Nso7 Akuku oké osimiri gābu-kwa-ra ndi ulo Juda fọduru; n'elu ha ka ha gāzù igwè ewu na aturu-ha: n'ulo nile nke Ashkelon ka ha gāmakpu amakpu n'anyasi; n'ihi na Jehova, bú Chineke-ha, gēleta ha, me ka ndi-ha adọtara n'agha lata. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a7 Ala nke dị nʼakụkụ oke osimiri ga-aghọ ala nke ndị ahụ fọdụrụ na Juda, ebe ha ga-achọtara anụ ụlọ ha ahịhịa. Ha ga-anọkwa nʼụlọ ndị Ashkelọn nke tọgbọrọ nʼefu, dinaa ala zuru ike nʼoge uhuruchi. Onyenwe anyị Chineke ha ga-elekọta ha, mekwaa ka ha nwetaghachi ihe nketa ha niile. Faic an caibideil |
Ubi ka agāzú nēgo, de kwa aha n'akwukwọ-ha, ka kwa ha akàrà, kpọ kwa ndi-àmà, n'ala Benjamin, na n'ebe nile di Jerusalem buruburu, na n'obodo nile nke Juda, na n'obodo nile nke ugwu, na n'obodo nile nke ebe di ala ala, na n'obodo nile nke Negeb: n'ihi na M'gēme ka ndi-ha adọtara n'agha lata; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
N'ihi nka, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, puta), n'ezie Moab gādi ka Sọdọm, umu Amon gādi kwa ka Gọmọra, ihe-onwunwe nke akuba, na olùlù-nnú, na ebe tọb͕ọrọ n'efu rue mb͕e ebighi-ebi: ndim fọduru gāluta ihe-ha n'agha, ndi mbam fọduru gēketa kwa ha.