Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Zefanaya 2:5 - Bible Nso

5 Ahuhu diri ndi bi n'akuku oké osimiri, bú mba ndi Keret! Okwu Jehova nēmegide unu, Kenean, ala ndi Filistia; M'gēme kwa ka i la n'iyì ghara inwe onye-obibi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Ahụhụ dịrị unu ndị bi nʼakụkụ oke osimiri, unu bụ ndị Keret; okwu Onyenwe anyị na-emegide unu, Kenan, ala ndị Filistia. Ọ sịrị, “Aga m ala gị nʼiyi, ruo na ọ dịghị onye ga-afọdụ ndụ nʼime gị.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Zefanaya 2:5
14 Iomraidhean Croise  

Aṅurila ọṅu, gi Filistia, ka i ra, n'ihi na anyajiwo ndele nke nēti gi-ri: n'ihi na ihe nke gēsi na nkpọrọgwu agwọ puta bu ubí, nkpuru-ya gābu kwa agwọ yiri ọku nēfe efe.


Ndi bu ọkpara nke ndi nēnweghi ike gāzù kwa onwe-ha dika aturu, ndi-ob͕eye gāmakpu kwa na ntukwasi-obi: ma M'gēme ka nkpọrọgwu-gi nwua site n'oké unwu, ọ bu kwa ndi-gi fọduru ka o gēb͕u.


Ì gesi aṅa di jū, ebe Jehova nyeworo gi iwu? imegide Ashkelon, na imegide ọnu-miri nke oké osimiri, n'ebe ahu ka Ọ kaworo ya.


n'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a, Le, M'gaje iseti akam n'aru ndi Filistia, bipu ndi Keret, me ka ndi ọnu-miri oké osimiri fọduru la n'iyì.


Nurunu okwu a nke Jehova kwuworo megide unu, umu Israel, megide ab͕uru ahu nile nke M'mere ka ha si n'ala Ijipt rigoputa, si,


Nurunu okwu a nke Mu onwem nēbuli n'isi unu ka ọ buru abù-ákwá, unu ulo Israel.


Kwasienu ákwá ike, unu ndi bi na Maktesh, n'ihi na ndi Kenean nile alawo n'iyì: ebipuwo ndi nile eboro ọla-ọcha.


Ebipuwom mba di iche iche, ulo-nkuku nile ha tọb͕ọrọ n'efu; emewom ka èzí nile ha buru nkpọnkpọ-ebe, onye-ngabiga we ghara idi: emebisiwo obodo nile ha, onye ọ bula we ghara idi, ha we ghara inwe onye-obibi.


Ma otú ọ di, okwum nile na ukpurum nile nke M'nyere ndi-orùm, bú ndi-amuma, n'iwu, hà erughi nna-unu-hà aru? ha we chigharia, si, Dika Jehova nke usu nile nke ndi-agha zubere ime ayi, dika uzọ nile ayi si di, na dika omume nile ayi si di, otú a ka O mesoworo ayi.


Ha we chọ uzọ ijide Ya; ma ha turu egwu ìgwè madu ahu; n'ihi na ha mara na Ọ turu ilu a imegide ha; ha we rapu Ya, la.


Nka bu ala nke fọduru: buruburu-ala nile nke ndi Filistia, na ndi Geshua nile;


site na Shaihoa ahu, nke di n'iru Ijipt, we rue ókè-ala Ekron n'akuku Ugwu, ndi Kenean ka aguru ya nye: ndi-isi ise nke ndi Filistia; ndi Geza, na ndi Ashdod, na ndi Ashkelon, na ndi Gat, na ndi Ekron; ndi Avim kwa,


bú ndi-isi ise nke ndi Filistia, na ndi Kenean nile, na ndi Zaidon, na ndi-Haivait ndi bi n'ugwu Lebanon, site n'ugwu Beal-heamon rue nbata Hemat.


Ayi onwe-ayi madere na Negeb nke ndi Keret, made kwa n'ala nke Juda nwere, made kwa na Negeb nke Keleb; ayi we sure Ziklag n'ọku.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan