Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Zefanaya 2:10 - Bible Nso

10 Nka ka ha gēnwe n'ihi npako-ha, n'ihi na ha atawo ndi Jehova nke usu nile nke ndi-agha uta, me onwe-ha uku imegide ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Ihe ndị a bụ ụgwọ ọrụ ha ga-anata nʼihi ịnya isi ha, na nʼihi nkọcha na ịkwa emo ha megide ndị nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Zefanaya 2:10
18 Iomraidhean Croise  

O kweghi ka nwoke ọ bula meb͕ue ha; O we bara ndi-eze nba n'ihi ha;


Moses na Eron we bakuru Fero, si ya, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke ndi-Hibru, siri, Rùe ole mb͕e i gāju iweda onwe-gi n'ala n'irum? zipu ndim, ka ha we fèm.


Ì nọ nātuli onwe-gi elu dika obo-ihe imegide ndim rue ub͕u a, na i gaghi-ezipu ha?


Ayi anuwo ihe bayere npako Moab, na ọ nāpako npako nke-uku; ọbuná ihe bayere nganga-ya, na npako-ya, na nrubiga-ókè-iwe-ya; ihe nēzighi ezi ka ekwukwu-ya nile bu.


Otú a ka Jehova kwuru megide ndi-ab͕ata-obi ọjọm nile, ndi nēmetu ihe-nketa ahu aka nke M'meworo ka ndim, bú Israel, keta: le, M'gaje iropu ha n'elu ala-ha, ulo Juda ka M'gēropu kwa n'etiti ha.


Ùnu si aṅa si, Ndi-dike ka ayi bu, na ndi bu dìnkpà ibu agha?


Ayi anuwo ihe bayere npako Moab, na ọ nāpako npako nke-uku; ọbuná ihe bayere idi-elu-ya, na npako-ya, na nganga-ya, na nbuli-elu nke obi-ya.


Ọrurú-ya di n'ọnu-ọnu-ala nile nke uwe-nwuda-ya; o chetaghi ikpe-azu-ya; O we rida n'uzọ di ebube; ọ dighi onye-nkasi-obi o nwere: Jehova, le nweda-n'alam; n'ihi na onye-iro emewo onwe-ya ka ọ di uku.


N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na i kuwo aka, zọ ukwu n'ala, ṅuria ọṅu na nleli-gi nile nime nkpuru-obi-gi megide ala Israel;


Ub͕u a mu onwem, bú Nebukadneza, nāja, nēbuli, nāsọpuru Eze nke elu-igwe; n'ihi na ọlu-Ya nile bu ezi-okwu, uzọ-Ya nile bu kwa ikpé: ọzọ, ndi nējeghari na npako, Ọ puru ime ka ha di ala.


N'ubọchi i guzoro iche na ncherita-iru, n'ubọchi ndi ala ọzọ dọtara usu-ndi-agha-ya n'agha, mb͕e ndi mba ọzọ bata-kwa-ra n'ọnu-uzọ-ama-ya nile, fekwasi Jerusalem nzà, ọbuná gi onwe-gi nọ ka otù nime ha.


Nganga nke obi-gi arafuwo gi, gi onye bi na nb͕awa nile nke nkume di elu, ebe di elu ka ebe-obibi-ya bu; onye nāsi n'obi-ya, Ònye gēme ka m'ridarue ala?


Anuwom ita-uta Moab, na nkwulu nile nke umu Amon, nke ha jiworo ta ndim uta, me onwe-ha uku megide ókè-ala-ha.


Otú ahu, unu ndi bu nwata, donu onwe-unu n'okpuru ndi-okenye. Ma unu nile were obi di ume-ala ke onwe-unu dika ákwà, ijerita ibe-unu ozi: n'ihi na Chineke nēdo Onwe-ya imegide ndi-npako, ma Ọ nēnye ndi di ume-ala n'obi amara.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan