Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Zefanaya 1:16 - Bible Nso

16 ubọchi opì-ike na iti-nkpu agha, imegide obodo nile ewusiri ike, na imegide ulo-nkuku nile di elu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 ụbọchị opi ike na iti mkpu agha imegide obodo niile e wusiri ike, na imegide akụkụ ụlọ elu niile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Zefanaya 1:16
17 Iomraidhean Croise  

Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na agāfù opì-ike uku; ha gābia kwa, bú ndi nāla n'iyì n'ala Asiria, na ndi achusara achusa n'ala Ijipt; ha gākpọkwa isi ala nye Jehova n'ugwu nsọ ahu nime Jerusalem.


n'ihi na arapuwo ulo-elu; ab͕anariwo ìgwè obodo; Ofel na ulo nche anọchiwo n'ọnọdu ọb͕à rue mb͕e ebighi-ebi, ebe obi-utọ nke inyinya-ibu-ọhia, ebe-ita-nri nke ìgwè aturu di iche iche;


Ayi nāsọghari ìsì na mb͕idi dika ndi-ìsì, e, ayi nāsọghari ìsì dika ndi nēnweghi anya: ayi asuwo ngọngọ n'etiti-ehihie dika ọ bu chi-ojiji; n'etiti ndi nwere ezi ndu ayi nọ ka ndi nwuru anwu.


Laghachinu n'ulo ọsọsọ, unu umu Benjamim, site n'etiti Jerusalem, fù-kwa-nu opì-ike nime Tekoa, buli-kwa-nu ihe-nbuli n'elu Bet-hakarem: n'ihi na ihe ọjọ si n'Ugwu eleputa anya, ya na ntipia uku.


Site na Dan ka anuru ima-imi nke inyinya-ya nile: site n'olu ọbube nile nke inyinya-ya nile di ike ala nka nile amawo jijiji; ha we bia richapu ala na ùjú-ya; obodo na ndi bi nime ya.


Chi-ọbubọ abiakutewo gi, gi onye bi n'ala ahu: mb͕e nke gi abiawo, ubọchi nke gi di nso; ọ bu ọb͕ub͕a-aghara, ọ bughi iti-nkpu-ọṅù, n'elu ugwu-gi nile.


Fùanu opì-ike nime Gibea, Fùanu opì nime Rema: tienu nkpu agha nime Bet-even: n'azu gi, Benjamin.


Tiye opì-ike n'okpo-ọnu-gi. Dika ugo ka ọ nābia megide ulo Jehova; n'ihi na ha agabigawo pua n'ọb͕ub͕a-ndum, ọ bu kwa iwum ka ha jehieworo megide.


Fùanu opì-ike nime Zaion, ti-kwa-nu nkpu agha n'ugwu nsọm; ka ndi nile ndi bi n'ala nka ma jijiji: n'ihi na ubọchi Jehova nābia, n'ihi na ọ di nso;


Àgāfù opì-ike n'obodo, ndi-ya aghara ima jijiji? ihe ọjọ, ọ̀ gādi n'obodo, ma Jehova emeghi ya?


O guzoro, we tùa uwa; O lere anya, we me ka mba nile kuja: Ewe tipia ugwu nile di mb͕e ebighi-ebi, Ugwu ntà ebighi-ebi nile ruru ala; Ojije nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga bu nke Ya.


Ọ gānọchigide kwa gi n'agha n'ọnu-uzọ-ama-gi nile, rue mb͕e mb͕idi-gi nile gāda, bú mb͕idi ahu di elu nke ewusi-kwa-ra ike, nke gi onwe-gi nātukwasi obi na ha, n'ala-gi nile: ọ gānọchigide kwa gi n'agha n'ọnu-uzọ-ama-gi nile n'ala-gi nile, nke Jehova, bú Chineke-gi, nyeworo gi.


Ndi Israel we tie nkpu, ndi-nchu-àjà we fùa opì-ike asa ahu: o rue, mb͕e ndi Israel nuru olu opì-ike, na ndi Israel tiri oké nkpu, mb͕idi ahu we da n'okpuru ya, ndi Israel we rigo n'obodo ahu, nwoke ọ bula na ncherita-iru ya, ha we were obodo ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan