Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Zefanaya 1:13 - Bible Nso

13 Àkù-ha gāghọ kwa ihe apunaraworo ha, ulo nile ha gāghọ kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu: e, ha gēwu ulo, ma ha agaghi-ebi nime ha; ha gāku kwa ubi-vine, ma ha agaghi-aṅu manya-vine-ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Akụ ha ga-abụ ihe a kwakọrọ nʼike, a ga-akwatukwa ụlọ ha niile. Ọ bụ ezie na ha ga-ewu ụlọ, ma ha agaghị ebi nʼime ha; ọ bụ ezie na ha ga-akọ ubi vaịnị, ma ha agaghị aṅụ mmanya si na ha.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Zefanaya 1:13
24 Iomraidhean Croise  

M'we si, Rùe ole mb͕e, Onye-nwe-ayi? O we si, Rue mb͕e obodo nile tọb͕ọrọ n'efu nēnweghi onye-obibi, ulo nile kwa, nēnweghi madu; rue mb͕e emeworo ka ala ndi ahu tọb͕ọrọ n'efu, ọbuná ebe tọb͕ọrọ n'efu,


Ume-gi na àkù-gi nile ka M'gēnye ka ọ buru ihe-nluta-n'agha, ọ bughi n'ihi ọnu-ahia, ma n'ihi nmehie-gi nile, ọbuná n'ókè-ala-gi nile.


Gi ugwum nke di n'ọhia, ume-gi na àkù-gi nile ka M'gēnye ka ọ buru ihe-nluta-n'agha, M'gēnye kwa ebe-gi nile di elu, n'ihi nmehie, n'ókè-ala-gi nile.


Ntipia n'elu ntipia ka anākpọ; n'ihi na ebibiwo ala nka nile: na mberede ka ebibiworo ulo-ikwūm nile, n'otù ntabi-anya ka ebibiworo ákwà-nkwubam nile.


Ọdum esiwo n'alughi-ulù-ya rigo, bú onye nēbibi mba di iche iche; o buliwo ije-ya, o siwo n'ọnọdu-ya puta; ime ka ala-gi ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu; obodo-gi nile gāghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ghara inwe onye-obibi.


Ha gērichapu kwa owuwe-ihe-ubi-gi, na nri-gi, nke umu-gi ndikom na umu-gi ndinyom nēri: ha gērichapu ìgwè ewu na aturu-gi na ìgwè ehi-gi: ha gērichapu osisi vine gi na osisi fig i: ha gēji mma-agha titu obodo-gi nile ewusiri ike, nke gi onwe-gi nātukwasi ha obi.


M'gēme kwa Jerusalem ka ọ ghọ obo-ihe obo-ihe, ebe-obibi nke nkita-ọhia; ọzọ, obodo nile nke Juda ka M'gēme ka ha ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, onye-obibi we ghara idi.


N'ihi na olu nke igo-ákwá ka anuworo site na Zaion, Le ka esi bibisia ayi nke-uku! ihere emewo ayi nke-uku, n'ihi na ayi arapuwo ala-ayi, n'ihi na ha atudawo ebe-obibi nile ayi.


Ihe-nketa-ayi ab͕anwewo ihe ndi ala ọzọ, Ulo nile ab͕anwewo ihe ndi mba ọzọ.


M'we wukwasi ha ajọ iwem dika miri; ọku nke nrubiga-ókè nke iwem ka M'jiworo me ka ha gwusia: uzọ-ha ka M'tiyekwasiworo n'isi-ha; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


Ọla-ọcha-ha ka ha gātufu n'èzí nile, ọla-edo-ha gāghọ kwa ihe-isọ-nsọ; ọla-ọcha-ha na ọla-edo-ha agaghi-enwe ike inaputa ha n'ubọchi nrubiga-ókè nke iwe Jehova; ha agaghi-eme ka afọ ju nkpuru-obi-ha, ha agaghi-emeju kwa ngiri-afọ-ha: n'ihi na ihe-isu-ngọngọ nke ajọ omume-ha ka ọ buworo.


M'gēnye kwa ya n'aka ndi ala ọzọ ibu ihe-nluta-n'agha, M'gēwere kwa ya nye ndi-nmebi-iwu nke uwa ibu ihe-nkwata; ha gēmeru kwa ya.


M'gēme kwa ka ndi ọjọ nke mba di iche iche bia, ha ewe nweta ulo nile ha: M'gēme kwa ka npako nke ndi di ike kwusi; agēme kwa ka ebe nsọ nile ha ghara idi nsọ.


N'ihi nka, ebe unu nāzọb͕u onye nēnweghi ike, ebe unu nānara kwa ya ọka wheat n'ùtú: ulo nkume awara awa ka unu wuworo, ma unu agaghi-ebi nime ha; ubi-vine anāchọsi ike ka unu meworo, ma unu agaghi-aṅu manya-vine-ha.


N'ihi nka ka agēji plough gwu Zaion dika ubi n'ihi unu, Jerusalem gāghọ kwa obo-ihe obo-ihe, ugwu nke ulo ahu gādi kwa ka ebe di elu nke oké ọhia.


Gi onwe-gi gāgha nkpuru, ma i gaghi-ewe ihe-ubi: gi onwe-gi gāzọcha nkpuru osisi olive, ma i gaghi-ete manu n'aru gi; i gāzọchapu kwa manya-vine ọhu, ma i gaghi-aṅu manya-vine.


M'gēji kwa nmehie onye ọ bula nke nāmabiga nbata-uzọ leta ya n'ubọchi ahu, bú ndi nēmeju ulo ndi-nwe-ha n'ihe-ike na aghughọ.


I gēkwe nkwa ilu nwunye, ma ya na nwoke ọzọ gēdina: i gēwu ulo, ma i gaghi-ebi nime ya: i gāku ubi-vine, ma i gaghi-eme ka ọ pua na nsọ anāsọ ya.


I gāku ubi-vine di iche iche, lu kwa ha, ma ọ dighi manya-vine i gāṅu, i gaghi-aghọ kọta kwa nkpuru-vine; n'ihi na ikpuru gēri ha.


ọ gēri kwa nkpuru nke anu-ulo-gi, na nkpuru nke ala-ubi-gi, rue mb͕e agēkpochapu gi: ọ gaghi-ekwe kwa ka ọka, na manya-vine ọhu, na manu, na umu ehi-gi muru, na umu ìgwè ewu na aturu-gi, fọduru gi, rue mb͕e ọ gēme ka i la n'iyi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan