Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Taịtọs 3:8 - Bible Nso

8 Okwu a kwesiri ntukwasi-obi, anamezube kwa ka i kwusie okwu bayere ihe ndia ike, ka ndi kweworo okwu Chineke we tukwasi uche n'ibu ndi-isi n'ọlu ọma. Ihe ndia di nma buru kwa ihe bara madu urù:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Okwu a kwesiri ntụkwasị obi, ọ ga-amasị m ma i kwusie ihe ndị a ike, ka ndị kweere na Chineke, lezie anya nʼịrụ ezi ọrụ. Ihe ndị a dị mma na-abakwara mmadụ uru.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Taịtọs 3:8
26 Iomraidhean Croise  

Ọ̀ bu Chineke ka madu nābara n'ihe? É-è, kama onye nwere uche nābara onwe-ya n'ihe.


N'ihi na ha ekweghi na Chineke, Ha atukwasighi kwa obi-ha na nzọputa-Ya.


Onye-àmà okwu-ugha gāla n'iyì: Ma onye nānu, rue mb͕e ebighi-ebì ka o gēkwu.


o we si ndi ahu, Unu onwe-unu ga kwa n'ubi-vine nkem, ihe ọ bula ziri ezi ka m'gēnye unu. Ha we je.


Jisus we tie nkpu, si, Onye kwere na Mu, ọ bughi na Mu ka o kwere, kama ọ bu n'Onye ziterem.


N'ezie, n'ezie, asim unu, Onye nānu okwum, nke nēkwere kwa Onye ziterem, o nwere ndu ebighi-ebi, ọ biaghi kwa n'ikpé, kama o sitewo n'ọnwu ba na ndu.


Ma ha siri ya, Anya adighi gi nma. Ma o nēkwusi ike na ọ bu otú a. Ha we si, Ọ bu mọ-ozi-ya.


Ma onye nālughi ọlu, kama ọ kwere n'Onye ahu Nke nāgu onye nāsọpughi Chineke n'onye ezi omume, anāgu okwukwe-ya nye ya dika ezi omume.


Ma ebe ayi nwere otù mọ nke okwukwe ahu, dika ihe edeworo n'akwukwọ nsọ si di, Ekwerem, n'ihi ya ka m'kwuru; ayi onwe-ayi kwere kwa, ọ bu kwa n'ihi ya ka ayi nēkwu;


Ka onye nēzu ori ghara izu kwa ori ọzọ: kama ka ọ dọb͕u onwe-ya n'ọlu, nēji aka ya abua lu ezi ihe, ka o we nwe ihe ya na onye nọ na nkpà gēketa.


Okwu a kwesiri ntukwasi-obi, kwesi kwa ka anara ya nke-ọma n'uzọ nile ọ bula, na Kraist Jisus biara n'uwa izọputa ndi-nmehie; ndi mu onwem bu onye-isi-ha:


Ya mere ezuberem ka ndikom nēkpe ekpere n'ebe nile ọ bula, nāchili aka di ọcha elu, nēweghi iwe, nārughi kwa uka.


onye anāb͕ara ya ezi àmà n'ọlu ọma; ọ buru na ọ zùputawo umu, ọ buru na o lewo ndi-ọbìa anya nke-ọma, ọ buru na ọ sawo ukwu ndi nsọ, ọ buru na o b͕owo nkpà ndi anākpab͕u, ọ buru na o sosiwo ezi ọlu nile ọ bula ike.


Ọ bu kwa n'ihi ihe a ka m'nāhu kwa ahuhu ndia: ma ihere adighi-emem; n'ihi na amataram Onye m'kweworo okwu-Ya, eme-kwa-ra ka m'kweye na Ọ puru iche ihe m'nyere n'aka-Ya idebe nche rue ubọchi ahu.


nējide okwu ahu nke kwesiri ntukwasi-obi nke di ka ozizí-ayi si di, ka o we pu idusi ọdu ike nime ozizí nke nēnye ezi ndu, na itu kwa ndi nēkwugide ekwugide nmehie-ha n'anya.


Onye nyere Onwe-ya n'ihi ayi, ka O we b͕aputa ayi n'imebi-iwu nile, sachakwara Onwe-ya otù ndi nke gābu ndi nke aka Ya, ndi obi-ha nānuru ọlu ọma ọku.


n'ihe nile nēme onwe-gi ihe-atù nke ọlu ọma; nime ozizí-gi nēgosi emebighi-emebi, ikwesi-nsọpuru,


Nēchetara ha ka ha nēdo onwe-ha n'okpuru ndi-isi, n'okpuru ndi nwere ike, ka ha nēkwenye ekweye, ka ha buru ndi edoziworo ilu ezi ọlu nile ọ bula,


Ka ndi-ayi muta kwa ibu ndi-isi n'ọlu ọma ib͕o nkpà nākpa umu-nna-ayi, ka ha ghara ibu ndi nāmighi nkpuru.


onye buri onye nābaghi n'ihe n'ebe i nọ n'oge gara aga, ma ub͕u a ọ bara gi n'ihe, ba-kwa-ram n'ihe:


ka ayi nātugharita kwa uche n'aru ibe-ayi ikpasu ihu-n'anya na ọlu ọma di iche iche;


ndi sitere n'aka-Ya buru ndi kwere na Chineke, Onye mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, we nye Ya ebube; ka okwukwe-unu na olile-anya-unu we di n'ebe Chineke nọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan