N'ihi na ọ bu iru nka ka ayi nādọb͕u onwe-ayi n'ọlu, nāb͕asi kwa nb͕a ike, n'ihi na ayi elewo anya Chineke di ndu, Onye bu Onye-nzọputa madu nile, ma nke kachasinu Onye nzọputa nke ndi kwere ekwe.
ma emere ka ọ puta ìhè ub͕u a site na ngosi nke Onye-nzọputa-ayi Kraist Jisus, Onye mere ka ọnwu ghara idi ìrè, site kwa n'ozi ọma Ya weputa ndu na emebighi-emebi n'ìhè,
ma O mere ka okwu-Ya puta ìhè n'oge nke aka Ya nime nkwusa, nke enyere n'aka mu onwem na ntukwasi-obi idebe dika ihe nke Onye-nzọputa-ayi Chineke nyere n'iwu si di;
n'ihi na asi na ọ di otú a Ọ ghaghi ihu ahuhu ọtutu mb͕e site na ntọ-ala nke uwa: ma otú ọ di, ọ bu nání otù mb͕e nime nruzu nke oge ndia ka emeworo ka Ọ puta ìhè, ka O we site n'ichu Onwe-ya dika àjà me ka nmehie ghara idi irè.