Ṅuria, nwa-okorọbia, na nwata i bu; ka obi-gi me kwa gi nma n'ubọchi nile nke okorọbia i bu, je kwa ije n'uzọ nile nke obi-gi, na n'ọhuhu-uzọ nke anya-gi abua: ma mara na n'ihi ihe ndia nile Chineke gēme ka i ba n'ikpé.
O gēru kwa ma emesia, na M'gāwusa Mọm n'aru anu-aru nile, bú madu; umu-unu ndikom na umu-unu ndinyom gēbu kwa amuma, ndi-okenye-unu gārọ nrọ, umu-okorọbia-unu gāhu ọhù:
Otú ahu, unu ndi bu nwata, donu onwe-unu n'okpuru ndi-okenye. Ma unu nile were obi di ume-ala ke onwe-unu dika ákwà, ijerita ibe-unu ozi: n'ihi na Chineke nēdo Onwe-ya imegide ndi-npako, ma Ọ nēnye ndi di ume-ala n'obi amara.
Ndi bu nna, anamedegara unu akwukwọ, n'ihi na unu amawo Onye ahu Nke di site na mbu. Umu-okorọbia, anamedegara unu akwukwọ, n'ihi na unu emeriwo ajọ onye ahu. Umu-ntakirim, edegaram unu akwukwọ, n'ihi na unu amawo Nna-ayi.