Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Rut 1:6 - Bible Nso

6 O we bilie, ya onwe-ya na nwunye abua nke umu-ya, ka o we si n>ala-ọhia Moab lata: n>ihi na ọ nuru n>ala-ọhia Moab na Jehova eletawo ndi-ya n>inye ha nri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Mgbe Naomi nọ nʼala Moab nụ na Onyenwe anyị eletala ndị Izrel site nʼinye ha ihe oriri, Naomi na ndị nwunye ụmụ ya abụọ kwadoro ịlaghachi azụ nʼala Izrel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Rut 1:6
27 Iomraidhean Croise  

Jehova we leta Sera dika Ọ siri, Jehova we me Sera dika O kwuru.


Jekob we kwe nkwa, si, Ọ buru na Chineke gānọyerem, debem n'uzọ a nke mu onwem nēje, nyem nri ka m'we rie, na uwe ka m'we yie,


Ọ we gọzie Josef, si, Chineke ahu, Nke nnam-hà, bú Abraham na Aisak, nējeghari n'iru Ya, Chineke ahu Nke nāzùm ogologo ogem rue taa,


Josef we me ka umu Israel ṅua iyi, si, Chineke gēleta unu n'ezie, unu gēsi kwa n'ebe a bugo ọkpukpum.


N'ihi na nkume-ya nile nātọ ndi-orù-Gi utọ, Ha nēme-kwa-ra ájá-ya amara.


Anu-ndọb͕u ka O nyeworo ndi nātu egwu Ya: Ọ gēcheta ọb͕ub͕a-ndu-Ya rue mb͕e ebighi-ebi.


Ihe-oriri-ya ka M'gāgọzi nke-uku: Ndi-ob͕eye-ya bu ndi M'gēji nri me ka afọ ju ha.


Anya ihe nile nēle anya Gi; Gi onwe-gi nēnye kwa ha ihe-oriri-ha na mb͕e-ya.


Onye nēmere ndi anēmeb͕u ihe O kpere n'ikpe; Onye nēnye ndi agu nāgu nri: Jehova nātọpu ndi-nkpọrọ;


Ọ bu onye nēme ka ókè-ala-gi ghọ udo; Abuba ọka wheat ka O ji me ka i riju afọ.


Je, chikọta ndi-okenye Israel, si ha, Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà, Chineke nke Abraham na Aisak na Jekob, Ọ mewom ka m'hu Ya anya, Ọ si, Eletawom unu n'ezie, hu kwa ihe anēme unu n'Ijipt:


Ndi ahu we kwere: mb͕e ha nuru na Jehova letarari umu Israel, na Ọ hu-kwa-rari nweda-n'ala nke ha, ha rube isi kpọ isi ala.


Me ka ihe-efu na okwu-ugha di anya n'ebe m'nọ: Enyelam ọnọdu-ob͕eye ma-ọbu àkù; Me ka m'rie nri rurum:


N'ihi na dika oké miri-ozuzọ na snow si esi n'elu-igwe ezo, ma ọ bughi n'ebe ahu ka ọ nālaghachi, ma ọ buru na o bughi uzọ desia ala, we me ka o me ihe-omume, ka o pu kwa ihe-opupú; o we were nkpuru nye ọgha-nkpuru, were kwa nri nye onye nēri ihe;


N'ihi na otú a ka Jehova siri, Mb͕e ọgu arọ atọ na iri ruzuru nye Babilon, M'gēleta unu, me ka ezi okwum ahu guzosiere unu ike, n'ime ka unu lata n'ebe a.


Jehova we za, si ndi-Ya, Le, M'ganēzitere unu ọka-unu na manya-vine ọhu unu na manu ọhu unu, afọ ya ewe ju unu: M'gaghi-eme kwa unu ihe-ita-uta ọzọ n'etiti mba nile:


Akuku oké osimiri gābu-kwa-ra ndi ulo Juda fọduru; n'elu ha ka ha gāzù igwè ewu na aturu-ha: n'ulo nile nke Ashkelon ka ha gāmakpu amakpu n'anyasi; n'ihi na Jehova, bú Chineke-ha, gēleta ha, me ka ndi-ha adọtara n'agha lata.


Nye ayi nri ta nke gēzuru ayi n'ubọchi ta.


Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Onye-nwe-ayi, Chineke nke Israel; N'ihi na O letawo ndi-Ya, lu-kwa-ra ha ọlu nb͕aputa,


tuda kwa gi n'ala, na umu-gi bi nime gi; ha agaghi-arapu kwa nime gi otù nkume n'elu nkume-ibe-ya; n'ihi na i maghi oge nleta-gi.


ma ebe ayi nwere ihe-oriri na ihe ib͕okwasi n'aru, afọ gēju ayi n'ihe ndia.


nēbinu obi-unu nke-ọma n'etiti ndi mba ọzọ; ka ha we site n'ọlu ọma nile unu, nke ha nēle anya, nye Chineke otuto n'ubọchi nleta ahu nime ihe ahu ha nēkwutọ unu nime ya dika ndi nēme ihe ọjọ.


Mahlon na Kilion we nwu kwa, ha abua; o we fọdu n/an/i nwayi ahu site n>umu-ya abua site kwa na di-ya.


O we si n>ebe ọ nọ pua, ya na nwunye abua nke umu-ya; ha we je n>uzọ ilata n>ala Juda.


N'ihi na Jehova letara Hana, o we turu ime, mua umu-ndikom atọ na umu-ndinyom abua. Nwata ahu, bú Samuel, we nētó n'ulo Jehova.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan