6 N'ihi na ọ maghi ihe ọ gāza; n'ihi na ha nātu oké egwu.
6 (Ọ makwaghị ihe ọ ga-ekwu nʼihi na oke egwu tụrụ ha.)
Pita we za, si Jisus, Rabai, ọ di nma ka ayi nọ n'ebe a: ka ayi ma kwa ulo-ikwū atọ; ka otù diri Gi, ka otù di-kwa-ra Moses, ka otù di-kwa-ra Elaija.
Igwe-oji we bia kpuchie ha: olu we si n'igwe-oji ahu puta, si, Onye a bu Ọkparam M'huru n'anya: nurunu okwu-Ya.
O we rue, mb͕e ha si n'ebe Ọ nọ nēkewapu, Pita si Jisus, Nna-ayi, ọ di nma ka ayi nọ n'ebe a: ka ayi ma kwa ulo-ikwū atọ; ka otù diri Gi, ka otù di-kwa-ra Moses, ka otù di-kwa-ra Eliaja: n'ihi na ọ mataghi ihe ọ nēkwu.
Mb͕e m'huru Ya, m'we da n'ala n'ukwu-Ya dika onye nwuru anwu. O we bikwasim aka-nri-Ya, si, Atula egwu; Mu onwem bu onye mbu na onye ikpe-azu,