46 ebe ikpuru-ha nādighi-anwu, ọku-ha adighi-anyu kwa anyu.
46 ebe “ ‘ikpuru ya na-adịghị anwụ anwụ, ọkụ ya adịghị anyụkwa anyụ.’
Ọ buru kwa na ukwu-gi eme gi ka i ma n'ọnyà, bipu ya: ọ di gi nma ibà na ndu na ngwurọ, kari inwe ukwu-gi abua atubà gi n'ọku ala-mọ;
Ọ buru kwa na anya-gi eme gi ka i ma n'ọnyà, tupu ya: ọ di gi nma ibà n'ala-eze Chineke nēnwe otù anya, kari inwe anya abua atubà gi n'ọku ala-mọ;
Ọgaranya ahu we kpọ òkù, si, Nna, Abraham, merem ebere, zite Lazarọs, ka ọ detu ọnu-ọ̀nu nkpisi-aka-ya na miri, we mejua irem; n'ihi na anọm n'aru-ufu nime ire-ọku a.