Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Mak 9:41 - Bible Nso

41 N'ihi na onye ọ bula nke gēkuru otù iko miri nye unu ṅua, n'ihi na unu bu ndi nke Kraist, n'ezie asim unu, na ọ gaghi-etufu ugwọ-ọlu-ya ma-ọli.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

41 Nʼeziokwu asị m unu, onye ọbụla ga-ekunye unu otu iko mmiri nʼaha m, nʼihi na unu bụ ndị nke Kraịst, ga-anatakwa ụgwọ ọrụ ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Mak 9:41
11 Iomraidhean Croise  

Onye ọ bula nke gēkuru nání iko miri oyi nye otù onye nime ndi ntà ndia ṅua n'aha onye nēso uzọm, n'ezie asim unu, ọ gaghi-etufu ugwọ-ọlu-ya ma-ọli.


Eze ahu gāza kwa, si ha, N'ezie asim unu, Ka ọ ra, bú otú unu si me ya nye otù onye nime umu-nnam ndia, bú ndi dikarisiri ntà, Mu ka unu mere ya nye.


Mb͕e nání Ya nọ, ndi nọ Ya buruburu na ndikom iri na abua ahu we jua Ya ilu ahu.


N'ihi na asi na n'ihi ihe-oriri ọ nēwuta nwa-nna-gi, i dighi-ejeghari ọzọ dika ihu-n'anya si di. Ewela ihe-oriri-gi la onye ahu n'iyì, bú onye Kraist nwuru n'ihi ya.


Ma unu onwe-unu anọghi n'anu-aru, kama unu nọ nime Mọ Nsọ, ma ọ buru na ọbu ezie na Mọ nke Chineke nēbi nime unu. Ma ọ buru na onye ọ bula enweghi Mọ nke Kraist, onye ahu abughi nke Ya.


Ma madu nile n'otù n'otù n'usoro nke aka ha: Kraist, dika nkpuru mbu; emesia ndi nke Kraist, n'ọbibia-Ya.


ma unu onwe-unu bu ndi nke Kraist; ma Kraist bu nke Chineke.


Unu nēle ihe di n'iru unu anya. Ọ buru na onye ọ bula atukwasiwo obi n'onwe-ya na ya bu onye Kraist, ya gua nka ọzọ n'onwe-ya, na, dika ya onwe-ya bu onye Kraist, otú a ka ayi onwe-ayi bu kwa.


Ma ọ buru na unu onwe-unu bu ihe di n'aru nke Kraist, ya mere unu bu nkpuru Abraham, buru ndi-nketa dika nkwa si di.


Ma ndi nke Kraist-ayi Jisus kpọgidere anu-aru-ha n'obe, ya na ọchichọ ọjọ nile na agu ihe ọjọ nile di ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan