Emesia emere ka Ọ puta ìhè nye ndi-ozi iri na otù onwe-ha mb͕e ha nọduru na nri; O we ta ekweghi-ekwe-ha na obi-etili-ha uta, n'ihi na ha ekweghi okwu ndi huru Ya mb͕e emesiri ka O si n'ọnwu bilie.
Ihe ndia ndi nēso uzọ-Ya amaghi na mbu: kama mb͕e enyereri Jisus otuto, mb͕e ahu ka ha chetara na edereri ihe ndia bayere Ya n'akwukwọ nsọ, na ha me-kwa-ra Ya-ri ihe ndia.
Jisus mara na ha nāchọ iju Ya, O we si ha, Ùnu nājurita onwe-unu ihe bayere nka, na M'siri, Ọ fọduru nwa oge, unu adighi-ahukwam ọzọ; ọzọ kwa, ọ fọduru nwa oge, unu gāhukwam?
Mb͕e Ọ nēkwu nka ndi nēso uzọ-Ya biara; o we ju ha anya na Ya na nwanyi nēkwurita okwu: otú ọ di, o nweghi onye ọ bula siri, Gini ka I nāchọ? ma-ọbu, Gini mere Gi na ya nēkwurita okwu?