Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Mak 9:3 - Bible Nso

3 uwe-Ya nile we nēnwupu, nācha oké ucha; dika onye ọ bula nke nēme ka ákwà di ocha n'uwa nāpughi ime ka ha di ọcha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Uwe ya na-enwu ọcha karịa ụdị ọcha ọbụla anya hụrụla. Ọ dịkwa ọcha karịa nke onye ọbụla nʼụwa nwere ike ime ka ihe dị ọcha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Mak 9:3
13 Iomraidhean Croise  

I gēwere hyssop wepu nmehiem, m'gādi kwa ọcha: I gāsucham dika ákwà, m'gādi kwa ọcha kari snow.


Mb͕e Onye Nke puru ime ihe nile chusara ndi-eze nime ya, Snow nēzò na Zalmon.


Biko bianu, ka ayi rurita uka, bú ihe Jehova nāsi: ọ buru na nmehie-unu adi ka uwe uhie, ọ bu dika snow ka ha gādi ọcha; ọ buru na ha acha uhie uhie dika ogho uhie, ọ bu dika aji ọcha ka ha gādi.


Anọm nāhu rue mb͕e atudasari oche-eze di iche iche, otù Onye ochie we nọdu ala: uwe-Ya di ọcha dika snow, agiri-isi nke isi-Ya di kwa ka aji-anu nwupuru enwupu; oche-eze-Ya bu ire ọku ire ọku, wheel-Ya nile bu ọku nēre ere.


Oyiyi-ya di ka àmùmà, uwe-ya nācha kwa ucha dika snow:


Ewe me ka ha hu Elaija na Moses: ha na Jisus nēkwurita kwa okwu.


Mb͕e Ọ nēkpe ekpere, oyiyi iru-Ya we di iche, uwe-Ya we nācha ucha nēb͕u kwa dika àmùma.


Kọniliọs we si, Ubọchi anọ gara aga, rue oge hour nka, m'nēkpe ekpere n'oge hour nke-iteghete n'ulom; ma le, otù nwoke guzoro n'irum n'uwe nēnwu enwu,


ka unu we rie anu-aru ndi-eze, na anu-aru ndi-ọchi-agha, na anu-aru ndi di ike, na anu-aru inyinya na nke ndi nānọkwasi ha, na anu-aru madu nile, ma ndi nwere onwe-ha ma ndi-orù, ma ndi ntà ma ndi uku.


M'we si ya, Onye-nwem, gi onwe-gi matara. O we sim, Ndia bu ndi nēsi n'oké nkpab͕u ahu puta, ha sa-kwa-ra uwe-nwuda-ha, me kwa ka ha di ọcha nime ọbara Nwa-aturu ahu.


Mb͕e ihe ndia gasiri m'we hu, ma le, oké ìgwè madu, nke onye ọ bula nāpughi iguta ọnu, ndi si na mba nile ọ bula, na ebo nile, na ndi nile, na asusu nile, puta, nēguzo n'iru oche-eze ahu na n'iru Nwa-aturu ahu, eb͕okwasiworo ha uwe-nwuda di ọcha, igu-nkwu di kwa n'aka-ha;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan