27 Ma Jisus jidere ya n'aka, palie ya elu; o we bilie.
27 Ma Jisọs jidere ya nʼaka selite ya elu, mee ka o guzo nʼụkwụ ya. O guzokwara.
N'ihi na Mu onwem, Jehova, Chineke-gi, nējidesi aka-nri-gi ike, bú Onye nāsi gi, Atula egwu, Mu onwem eyeworo gi aka.
Ma mb͕e achupuru ìgwè madu ahu, Ọ ba nime, jide ya n'aka; nwa-ab͕ọghọ ntà ahu we bilie.
O we jekuru ya, jide ya n'aka, palie ya; aru-ọku ahu we rapu ya, ọ nējere ha ozi.
O we nwe ọmiko, setipu aka-Ya, metu ya, si ya, Anamachọ; ka eme ka i di ọcha.
O we jide nwatakiri ahu n'aka, si ya, Talita kumi; nke bu, ma asugharia ya, Nwa-ab͕ọghọ ntà, asim i, Bilie.
O we jide onye-ìsì ahu n'aka, duputa ya n'obodo ntà ahu; mb͕e Ọ busara ya ọnu-miri n'anya, bikwasi kwa ya aka-Ya abua, O we jua ya, si, Ọ̀ di ihe i huru?
Mb͕e o tisiri nkpu, sesi kwa ya ike, o we puta: nwa ahu we di ka ozu; ya mere ndi ka nime ha si, Ọ nwuruwo.
Mb͕e Ọ batara n'ulo-ha, ndi nēso uzọ-Ya we jua Ya iche, si, Gini mere ayi onwe-ayi apughi ichupu mọ ahu?
Onye-isi-ọchi-agha we jide ya n'aka, wezuga onwe-ya we jua ya iche, si Gini bu ihe i nwere ikọrọm?
O we jide ya n'aka-nri, palie ya: ngwa ngwa ukwu-ya abua na nkwonkwo-ukwu-ya we nwe ume.
O we nye ya aka-ya, palie ya elu; mb͕e ọ kpọsiri ndi nsọ na ndinyom ndi di-ha nwuru, ọ che ya na ndu n'iru ha.