Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Mak 9:2 - Bible Nso

2 Mb͕e ubọchi isi gasiri Jisus chiri Pita na Jemes na Jọn tiyere Onwe-ya, O kuru ha rigo n'ugwu di elu we pua iche, nání ha: O we nwogha n'iru ha:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Mgbe ụbọchị isii gasịrị, Jisọs kpọọrọ Pita na Jemis na Jọn, duru ha rigoro nʼelu ugwu dị elu. Nʼebe ahụ ka ha nọdụrụ naanị ha. Nʼebe ahụ, a gbanwere ọdịdị ya nʼihu ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Mak 9:2
23 Iomraidhean Croise  

O do nkú n'usoro, bọ oke-ehi-ya n'ọbubọ-ya, tukwasi ya n'elu nkú. Ọ si, B͕ajuenu okpokoro anọ miri, wukwasi ya n'elu àjà-nsure-ọku, na n'elu nkú.


Ehab we rigo iri ihe na iṅu ihe-ọṅuṅu. Ma Elaija rigoro n'elu ugwu Kamel; o ruru ala, tiye iru-ya n'etiti ikperè-ya abua.


Moses we bilie, ya na Joshua onye nējere ya ozi: Moses we rigo n'ugwu nke Chineke.


Eze n'ima-nma-ya ka anya-gi abua gāhu: ha gāhu ala nke ebe nile ọ sọturu di anya.


N'ihi na o tolitere n'iru Ya dika ome, na dika nkpọrọgwu nke putara n'ala kpọrọ nku: ọ dighi udi-aru oma ọ nwere, ọ dighi kwa ima-nma; ayi we hu ya, ma ọ maghi nma n'ile ya anya nke ayi gēji chọsie ya ike.


Ma mb͕e Jisus nuru ya, O si n'ebe ahu wezuga Onwe-ya n'ub͕ọ, je iche rue ebe bu ọhia: mb͕e ìgwè madu nile nuru ya, ha we si n'obodo ahu nile so Ya n'ukwu ala.


O we kuru Pita na Jemes na Jọn tiyere Onwe-ya, ibobo we malite inwu Ya n'aru nke-uku, obi malite-kwa-ra ilọ Ya miri.


Ma mb͕e ihe ndia gasiri emere ka Ọ puta ìhè nye madu abua nime ha n'udi di iche, mb͕e ha nēje ije, nāga n'azu obodo.


O kweghi kwa onye ọ bula so Ya je, ma-ọbughi Pita, na Jemes, na Jọn nwa-nne Jemes.


O rue n'ubọchi ndia, na Ọ puru rigo n'ugwu ahu ikpe ekpere; O we nọgide n'ogologo abali ahu nile n'ikpe ekpere nye Chineke.


Okwu ahu we ghọ anu-aru, bú madu, O we biri n'etiti ayi, (ayi kiri-kwa-ra otuto-Ya, bú otuto dika otù nwa-nwoke amuru nání ya nānata n'aka nna-ya), O juputara n'amara na ezi-okwu.


Unu ekwe-kwa-la ka eme ka unu yie ajọ oge a: kama ka enwogha unu site n'ime ka uche-unu buru ihe ọhu, ka unu we nwaputa ihe bu ihe Chineke nāchọ, bú ezi ihe nke di kwa Ya ezi utọ nke zu-kwa-ra okè.


Nka bu ub͕ò nke-atọ m'nābiakute unu. N'ọnu ndi-àmà abua ma-ọbu atọ ka agēme ka okwu nile ọ bula guzo.


Onye gēme aru nke ọnọdu-ayi di ala ka o nwe oyiyi ọhu, ka ya na aru nke ebube-Ya we nwekọ otù udi, dika ilusi-ọlu-ike ahu si di nke O ji pu ọbuná ido ihe nile n'okpuru Onwe-ya.


M'we hu oké oche-eze di ọcha, na Onye nānọkwasi ya, Onye uwa na elu-igwe b͕apuru n'iru Ya; ahughi kwa ebe ọ bula nye ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan